Vladimir Putin bụ onyeisiala Rọshịa ga-achị afọ isii ọzọ

Vladimir Putin Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Vladimir Putin achịala mba Rọshịa n'ọkwa Praịm mịnịsta nakwa onyeisiala

Vladimir Putin bụ onye na-achị mba Rọshịa emeriela ntuliaka e mere iji họpụta onyeisiala ụnyaahụ.

Mmeri a o meriri pụtara na Putin ga-atụkwasị afọ isii n'elu afọ iri na itoolu ọ chịrịla.

Ọ nọrọla n'ọkwa Praịm Mịnịsta ma chịkwaa Rọshịa afọ 19, nke bụ site n'afọ 1999 ruo ugbu a.

Na ntuliaka e mere, Putin nwetara vootu 76 pasentị, karịrị 64 pasentị o nwetara n'afọ 2012.

Ebe Pavel Grudinin bụ onye na-achụsị Putin ike nwetara 12 pasentị, Ksenia Sobchak nwetara pasentị abụọ ebe Vladimir Zhirinovsky nwetara pasentị isii.

A kwụsịrị Alexei Navalny bu ndọrọndọrọ ọchịchị mmegide n'isi iso zọọ ndọrọndọrọ.

Ihe Putin kwuru

Ka o merichara, Putin gwara igwe mmadụ gbakọrọ na Mosko na ndị tunyeere ya vootu "hụrụ ihe ọma ndị o mepụtara n'afọ ole na ole gara aga".

Oge ọ na-aza ajụjụ ndị ntaakụkọ gbara ya gbasara ịzọ ndọrọndọrọ ọchịchị ma afọ isii nke a gachaa, O chịpụrụ ọchị ma sị "ihe ị na-ekwu na-atọ ọchị. Iche na aga m anọ ebe a ruo oge m gbara afọ 100? Mba!"

Ndị otu ya gwara Interfax nke Rọshịa na ọ bụ "ezigbote mmeri"

"Pasentị a anyị na-ahụ ugbua na-ekwuru onwe ya. Ọ bụ ihe Putin ga-eji mee mkpebi n'afọ ndị na-abịa n'ihu, o nwekwara ọtụtụ mkpebi ọ ga-eme."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara