China na Nọt Koriya ekwupụtala maka njem Kim Jong-un

Kim na Moon na ndị nwunye ha Image copyright Chinese TV Footage
Nkenke aha onyonyo Ndị ndu ahụ na nwunye ha gara nzụkọ ahụ

E kwupụtala na ọ bụ ezie na Kim Jong-un bụ onyeisiala mba Nọt Koriya mere njem gaa mba China.

Mba China na Nọt Koriya bụ ndị kwupụtara maka njem ahụ bụ nke mbụ Kim na-aga mba ofesi kamgbe afọ 2011 ọ bidoro ọchịchị.

Kim na onyeisiala mba China Xi Jingpin nwere ezi mkparịtaụka na Beinjing bụ isi obodo mba China.

China bụ mba ha na Nọt Koriya kachasị enwe mmekọrịa azụmahịa ebe ndị mmadụ tụrụ anya na ha ga-achọ ịma ihe ndị CHina chere tupu ha na mba Sawụtụ Koriya na US enwe izu.

Kim kwesiri izute onyeisiala mba Sawụtụ Koriya Moon Jae-in n'ọnwa Apreel nakwa onyeisiala mba US Donald Trump na n'ọnwa Mee.

Njem ahụ o mere gaa Beinjing bụ ụzọ pụrụiche iji kwado maka izu na mkparịaụka ahụ.

Na njem ahụ, Kim kwere ndị mba China nkwa na ya na-etinye uchu iwezuga ngwọ agha nukiliya ya mana ya nwere ọnọdụ.

N'okwu ya; "Okwu iwezuga ngwoagha nukiliya nwere ike ibụ ihe gara aga ma ọ bụrụ na mba Swaụtụ Koriya na mba US ga-emeso ha ezi omume, mepe ohere ikpe udo nakwa inye aka weta udo na ịganihu."

Akụkọ ga-amasị gị: