Malala Yousafzai alaghachila Pakistan

Malala
Nkenke aha onyonyo Yousafzai nke na-agụ akwụkwọ ugbua na mahadum Oxford dị na UK, nara mgbọ ahụ oge ọ dị afọ 15

Nwaanyị a ma ama ma turu ugo Nobel bụ Malala Yousafzai alaghachila obodo ya bụ Pakistan nke mbụ kemgbe ndị agha Taliban gbasịrị ya egbe n'afọ 2012.

Yousafzai bụ onye dị afọ 20 ugbua ma bụkwara onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara oke na ugwu ruru mmadụ natara mgbọ ahụ maka na ọ na-ekwupụta ka ụmụaka ụmụnwaanyị gụọ akwụkwọ.

Ya na onyeisiala mba Pakistan bụ Shahid Khaqan Abbasi kwesiri inwe ọgbakọ na njem ahụ o mere.

Ekwupụtaghị n'uju ihe gbasara njem ahụ ọ na-eme maka okwu gbasara nchekwa ya.

Mana ndị ọrụ mgbasaozi TV na Pakistan gosiri Malala na nne na nna ya na ọdọụgbọelu ndụ Pakistan na Islamabad dịka ha nọ ma nwe nchekwa pụrụ iche.

Njem ya kwesiri iru mkpụrụ ụbọchị anọ ebe ya na ndị ọrụ ya a na-akpọ Malala Fudn Group so mee ya bụ njem.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara