Falae: Atara m onwe m ụta maka ikwado Buhari

Olu Falae Image copyright SDP/Facebook
Nkenke aha onyonyo Obi adịghị Olu Falae, onye ndị ọchịehi wakporo ugbo ya ugboro ugboro mma

Onyeisioche otu SDP bụ Olu Falae emeela ngaramara maka nkwado o nyere onyeisiala Muhammadụ Buhari iji banye n'ọkwa ọchịchị na ntuliaka afọ 2015.

Falae kwuputara nke a oge ya na onye bụbu onyeisiala Olusegun Obasanjo, nwechara ọgbakọ n'ọbakwụkwọ ya dị n'Abeokuta ụbọchị Tuusde.

O kwuru na ọchịchị Buhari akụọla afọ n'ala.

"Okwu ihe gbasara Naijiria karịrị agụrụ ịnọ n'ọkwa ọchịchị nke onye ọbụla."

O kwu kwara sị "gọọmenti etiti maara, mụ onwe m makwara na ha emeghị nke ọma. Ihe kacha mkpa n'ọrụ ha bụ ichekwa ndụ ndị a na-achị mana gọọmenti a anaghị eme ya.

"A na-egbusi ndị mmadụ kwa ụbọchị, gọọmenti ọbụla enweghị ike ịkwụsị ya, adaala.

"Onyeisiala Buharị bụ enyi. Ọ bụrụ na unu cheta, E weliri m ya aka elu na Adamasingba Stadium dị n'Ibadan rịọ ndị mmadụ ka ha tụnyere ya n'ihi na anyị chere na ọ ga-ahazigharị Najirịa.

"Mana eziokwu bụ na o meghị ọfụma. Ana m enwe olileanya na dịka onye eziokwu na onye na-eche ezi echiche, na ọ ga-ele anya etu ihe si aga, na ọnọdụ ahụike ya, ma sị na ya agaghị azọ ọkwa ọchịchị ọzọ."

"Otu ihe m ji aka bụ na ọtụtụ ndị jịkọrọ aka chọọ mgbanwe maka ọdịmma na ime ihe ọbụla ga-ekwe omume iji wepụ Muhammadu Buhari maka ọdịmma onwe ya na ọdịmma ndị Naijiria niile."

Akụkọ ga-amasị gị:

Dịka o siri gbasa otu ahụ pụtara ọhụrụ nke ọbasanjọ nọ n'isi ya, Falae kwuru sị: "Eji m n'aka na ọ bụrụ na ndị Naijiria niile na-eche ezi echiche ga-ahụ mkpa ọ dị iji gbakọọ aka hụ na e nwere ezi mgbanwe, mgbanwe bara uru, mgbanwe maka ọganihu ga-eme n'afọ 2019.

Anyị niile chọrọ mgbanwe site n'oke enweghị ọrụ, mkpagbu na ogbugbu ọtụtụ ndị mmadụ, mgbanwe site n'iyiegwu ndị Boko Haram na ọnọdụ ndị mmadụ ịna-atụ egwu ịga n'ugbo ha, mgbanwe site n'obi mgharipụ na iwelite akụnaụba ala anyị."

Falae bụ odeakwụkwọ nke gọọmentị (SFG) n'ọge ọchịchị Ibrahim Babangida. Ọ rụkwara dịka odeakwụkwọ ukwu (Permanent Secretary) n'oge ọchịchị Olusegun Ọbasanjo dịka onyeagha site n'afọ 1977 ruo 1979.