Ndị ụka Kraist arụgharịala ụka ekwensu na mba Brazil

Conceição d'Lissá na Lusmarina Campos
Nkenke aha onyonyo Conceição d'Lissá na Lusmarina Campos ebe ha na-arụgharị ụlọ arụsị ahụ

Ndị otu Kraist enyela ndị ọdịnala a kpọrọ 'Candomblé' aka rụgharịa okwuarụsị ha na mba Brazil.

E nwere opeka mpe, wakpo asatọ e mere ndị Candomblé bụ otu ofufe ndị e rere n'ohu si Afrịka buga na Brazil n'afọ 2017.

Ofufe ha na-akwado ịchụ aja, ịgụ egwu ofufe ha na inwe dibịa na-echekwa okwuarụsị ha dịka ndị na-efe arụsị na mba Afrịka dị icheiche sị eme.

Nke a kpatara ndị ụka ọgba ọhụrụ dị ịcheiche jiri malite ịkpagbu ha, na-akpọ ha 'ndị ọrụ ekwensu' ma bido ibuso ha agha dị.

Otu onyeisi nchuaja Candomblé bụ Conceição d'Lissá, so na ndị a wakporo okwuarụsị ya ugborougboro ma mebikwa ya.

Nkenke aha onyonyo A wakporo ihe dịka okwuarụsị Candomblé asatọ n'afọ gara aga

Lusmarina Campos bụ otu ụkọchukwu ekwenyeghị na mmegbu a na-emegbu ha na ndị ụka ya na-enyere ha aka ịrụgharị okwuarụsị ha ndị ọzọ gbara ọkụ.

Otu onye so ha arụ ukwuarụsị ahụ bụ Celina Holtz kwuru na mbụ oso enye ndị ofufe Candomblé nsogbu maka na a kụziere ha na ndị ahụ na-efe chi ọjọọ.

Holtz si, "onweghị ihe m ma maka ha na mbụ, abịara m ugbu a ị mụta ọtụtụ ihe maka ha".

Mana ọ bụghị mmadụ niile ka ihe a dị mma n'obi.

Ndị mmadụ na-aluso ndị ụka Kraist a na-enyere ndị ọdịnala aka ọgụ.

Ihe onyonyo so akụkọ a bu ụzọ pụta na Websait BBC ọzọ

Isiokwu Ndị Emetụtara