Lee anụ ise obodo Igbo ụfọdụ na-asọ

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNsoala n'obodo ụfọdụ n'Igbo

N'ala Igbo, e nwere ọtụtụ nsọala zụrụ Igbo ọnụ nke na onye meerụọ ya, ọ kpụọ arụ maọbụ amapụ ya n'obodo.

Ha gụnyere ihe ndị a:

  • Nwaanyị anaghị awa oji, nke o ji arị nkwụ
  • Mmadụ anaghị alụ maọbụ dinaa nwanne ya maọbụ ọbara ya
  • Nwanne anaghị egbu nwanne ya. I mee ya na-amaghị ama, ị gba ọsọ ọchụ
  • Mmadụ anaghị edina anụmanụ
  • Nwoke anaghị edina nwoke ibe ya maọbụ nwaanyị, nwaanyị
  • Mmadụ agaghị akwụ ụdọ
  • Ọtụtụ obodo n'ala Igbo anaghị eri udele. N'ihi na ọ na-eri ihe nwụrụ anwụ nke gụnyere ozu mmadụ.

Dịka e nwere ihe Igbo zuzugbe na-asọ, nsọala ndị ọzọ bụ n'obodo n'obodo maọbụ na mpaghara na mpaghara.

Mana ka obodo siri dị icheiche ka ihe ha na-asọ siri dị icheiche.

Lee ihe ise ọtụtụ obodo dị n'Igbo na-asọ:

1.Ewi

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Igbuụzọ na ndị Nnewi anaghị eri ewi

Ndị Igboụzọ (Ibuzọ) dị na Delta steeti na-asọ ewi.

N'otu aka ahụ, ndị Nnewi dị n'okpuru ọchichị Nnewi-North na Anambara steeti anaghị eri ewi. Ha na-asọkwa eke.

2. kwa

Ndị Amaigbo dị na Mbaise na-asọ iri anụ ọkwa. Ndị Nnọkwa na Anambara steeti anaghị erikwa anụ ọkwa

3. Enwe

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Ọka anaghị eri enwe

Ndị Ọka (Awka) na ndị Ojoto n'Anambara steeti anaghị eri enwe.

Ndị obodo ọzọ na-asọ enwe bụ ndị Orodo n'Imo steeti.

Otu onye Orodo bụ Obinna Akunna gwara BBC na ihe ndị obodo ha ji asọ enwe bụ n'ihi na" o yiri mmadụ".

Ndị Agbo na Delta steeti na-asọ enwe. Ha na-egbu ya mana ha anaghị eri ya.

4. Eke-Uke/Nnobi/Oba

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Onye ọbụla gburu eke n'obodo a na-asọ ya na-akwa ya dịka e si akwa mmadụ

Otụtụ obodo dị n'Anambara steeti, ọkachasị ndị dị n'okpuru ọchịchi Idemili-North dịka Uke,Neni, Umuoji, Abatete, Nnobi, Awka-Etiti wdg...na-asọ eke.

Ha anaghị egbu ya maọbụ rie anụ ya.

Dịka Anachhuna Phillano otu onye Abba dị n'okpuru ọchịchị Njikọka,siri kwuo, ndị be ha na-asọkwa eke.

N'akụkụ ebe ụfọdụ n'Imo steeti na-asọkwa iri anụ eke.

Ihe ịtụnanya dị n'obodo ndị a na-asọ eke bụ na eke anaghị ata ha maọbụ chọọ ha okwu.

N'obodo ndị a, onye gburu eke na-akwa ya dịka e si akwa mmadụ.

5. Mbe

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị Awo-Idemili anaghị eri mbe, ebe e nwere mba na-ahụ anụ mbe dịka nnukwu ihe oriri

Ndị Awo-Idemili dị n'Imo steeti anaghị eri anụ mbe.

Ha na-asọkwa iri anụ eke.

Ndị Igbo na-aso anụ ụfọdụ ndị a n'ihi na ọ bụ chi ha na-efe n'oge gboo. Ebe ọtụtụ na-asọ ya namaghị ihe mere ha ji aso ya karịa kwa na ' ndị be anyị na-asọ ya.

Na nkọwa ya, ọkammụta na mmụta maka Afrịka na asụsụ na University of Lagos bụ Chigozie Nnabuihe kwuru na obodo ọbụla nwere ihe kpatara ha ji asọ ihe ha na-asọ.

"O nwere akụkọ so ihe ọbụla obodo ọbụla na-asọ."

Nnabuihe gara n'ihu sị, "N'obodo Agbọ, ha na asọ enwe. Ihe kpatara ha ji asọ enwe bụ na otu n'ime ndị eze chịrị ha bụ dinta.

"mgbe ọ na-achụ nta,ụmụanụ dogburu ya n'ọhịa. Ha kwenyere na ọ bụ ụwụ anụ nọ n'ezinaụlọ enwe. Ya kpatara ha anaghị eri enwe.

"Ebe ọbụla ha hụrụ enwe ha na-egbu ya, mana ha agaghị eri ya."

Gee nkọwa Nnabuihe n'uju ebe a:

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe kpatara obodo ji asọ ihe ha na-asọ - Ọkammụta

Mana dịka otu onye omenaala doro anya bụ Ezenka Agbarakwe siri kọwa, ihe mere ọtụtụ obodo n'ala Igbo ji asọ anụmanụ dị iche iche bụ "maka ihe anụ ndị ahụ mere ha."

Isiokwu Ndị Emetụtara