PFN: Kwụọ ụgwọ gbapụta Leah Sharibu

Ụmụ Dapchi Image copyright Isaac Linus Abrak
Nkenke aha onyonyo N'ọnwa Maachị 21, nke afọ 2018, ndị Boko Haram tọpụrụ ụmụakwụkwọ ụmụnwaanyị ndị Dapchị ha tọrọ dị 100

Onyeisi otu jịkọrọ ụka ọgba ọhụrụ na Naijiria nke a kpọrọ Pentecostal Fellowship of Nigeria (PFN) na bekee bụ Felix Omobude, agwala gọọmenti etiti ka ha kwụọ ụgwọ ma gbapụta Leah Sharibu, nwa Dapchi ndị Boko Haram kpachiri.

N'otu aka ahụ, otu jikọrọ ndị otu Kraist mbaụwa a kpọrọ, Christian Solidarity Worldwide (CSW), na bekee ga-amalite ime ka ọha nụrụ olu ha na sochal midia dịka ha na-eti mkpu ka a tọhapụ Leah Sharibu.

Cheta na ndị Boko Haram ka ji Leah Sharibu bụ otu n'ime ụmụaka ụmụnwaanyị dị 110 ndị Dapchị dị na Yobe steeti ha tọọrọ n'ọnwa Februari 19, n'ihi na o kwenyeghị ịjụ Kraịst.

Na mkparịtaụka Omobude na ụlọntaakụkọ Punch nwere, ọ kpokuru gọọmenti ka o mee ihe ọbụla dị n'ike ya iji gosi na ọ naghị akpa oke, na ha akwụnyeghịrị Boko haram. Ọ burugodi ịkwụ ụgwọ iji gbapụta ya, ha kwụọ.

Ọ sị: "Ọnọdụ Leah Sharibu a bụrụla nnukwu nsogbu n'ihi na ọ bụrụ na ndị ji ya ekwughị ihe ha jiri kpachie ya, ọ kara ịdị iche ma kwe nghọta. Mana ha were anya kwuo na ihe mere ha jiri jichie ya bụ maka okwukwe ya. Nke a so n'ihe mere ụfọdụ ndị Naijiria na-enyo ya bụ ihe enyo. Kedụ ihe mere na a tọrọ ụmụaka, gbahapụ ha ma jichie otu n'ime ha maka na ọ bụ onye otu Kraist?

Ọ bụrụ na gọọmenti emeghị ihe ọ bụla, ihe ọ pụtara bụ na ha nwere ebumnobi nke anyị amabeghị. Ụbọchị ọbụla Leah ka tọrọ na aka ndị ji ya, na-ebute obi mgbalielu n'etiti okperechi dị icheiche na Naijiria. Ana m akpoku gọọmenti ka ha mee ihe ọbụla dị n'ike ha iji gosi na ha anaghị akpa oke, na ha akwụnyeghịrị Boko haram. Ọ bụrụgodi ịkwụ ụgwọ iji gbapụta Leah, ha kwụọ."

Omobude gara n'ihu tụọ arịrị maka oke ogbugbu mmadụ na nsogbu nchekwa dị n'ala anyị ma rịọ gọọmentị na otu APC ka ha mejupụta nkwa 'mgbanwe' ha kwere.

N'akwụkwọ ozi nke otu CSW wepụtara nke onyeisi ha na mpaghara Afrịka na Middle-East bụ Khataza Gondwe tinyere aka, otu ahụ kwuru sị, "Ụbọchị Monde bụ ụbọchị ncheta afọ iri na ise e jiri mụọ Leah, CSW bu n'obi ibido atụmatụ ga-enye aka ka ọụwa nụrụ

Akụkọ ọzọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a