UAE na-enyezị ndị mmadụ visa afọ iri

Ebe foto si, @HHShkMohd
Ọkparaeze obodo Dubaị
Ndị isi ọchịchị mba United Arab Emirates na-enye ndị mmadụ akwụkwọ Visa afọ iri maka mmepe ụlọọrụ na azụmaahịa.
Ndị ha nyere ohere a gụnyere ndị dọkịta, ndị njinia, ndị nrụpụta ihe ọhụrụ na ndị oji ego achụ ego.
Ezinaụlọ ndị a nakwa ụmụakwụkwọ na eme nkeọma ga-enwete kwa ohere visa afọ iri ahụ.
Ebe foto si, @HHShkMohd
Ndị isi ọchịchị mba UAE
Ozi a si n'akara twitter ọkparaeze mba Dubaị na Praịm mịnịsta mba UAE bụ HH Sheikh Mohammed ụnyaahụ mgbe ha mechara mkparịta ụka ndị isi ọchịchị.
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị oji ego achụ ego ga-enwe ohere i mepe ma nwere ụlọọrụ nke ha kpam kpam.
Osote onyeisiala mba UAE enyela ụlọorụ na-ahụ maka visa ka ha tinye iwe n'ọrụ n'ọgụgụ afọ a.
Iwu a ga-enye ụmụakwụkwọ ohere i bi na UAE ma ha gụchaa akwụkwọ ha.