Trump akagbuola mkparịtaụka ya na Kim

trump na Kim

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto,

Trump na Kim kwesiri ịkparịta ụka n'abalị iri na otu ọnwa Juun na mba Singapore

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akagbuola mkparịtaụka ya na ogbo ya nke Nọt Korịa bụ Kim Jong-un kwesiri inwe.

Trump kwuru na "ụwa atụfuola oke ohere iji mee udo ga-adị ogologo oge".

O kwuru na ihe mere o jiri mee mkpebi a bụ maka "oke iwe na iro pụtara ihe" nke dị n'oke mba Nọt Korịa.

N'akwụkwọ ozi o degara Kim, o kwuru na ọ na-atụ anya izute ya "otu ụbọchị".

Nke a bịara n'elekere ole na ole mba Nọt Korịa kwuchara na o kposasịala ọwara dị n'ọdọ nrụpụta ogbunigwe nuklịa.

Ndị ntaakụkọ mba ndị ọzọ kwuru na ha nụrụ ụda ogbunigwe na mpaghara Punggye-ri.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: