Ndị Ireland ekpebiela na ụmụnwannyị nwere ikike ite ime

Nwannyị nọ n'ebe a na-eme ntụlịaka n'Ireland Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Obi ndị mmadụ dị na ntụlịaka emere

Ndị mba Ireland mere ntuliaka taa iji kagbuo otu usoro iwu na-achi mba ahụ nke ehiwere n'afọ 1983 bụ nke tinyere nwaanyị na nwa o bu n'afọ n'otu ogogo.

Ndị mmadụ were usoro iwu ahụ ka ihe gbochiri nwannyị dị ime ite nwa o bu n'afọ.

Ọgụgụ nke enwetere ugbua na ntuliaka nke taa na-egosi na percentị 68 na mba ahụ chọrọ ka-akagbuo ya bụ iwu, percent 30 n'ọma chọrọ ka-ahapụ ya etu ahụ ọ dị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Usoro tụgharị iwu ji obodo nke asato bụ ihe emere n'afọ 1983

Onye na-ekwụchitere ndi chọrọ ka ya bụ iwu nọọdụ bụ John McGuirk ekwenyerela na ndị chọrọ ka-akagbuo ya emeriela.

"Ndị be anyị entinyela ọnụ na ya bụ okwu, okwu wee danyere ndị ọzọ, agbanyeghi na m chọrọ ka ọ bụrụ etu ọzọ ka ọ pụtara," McGuirk kwuru.

Image copyright Brian Lawless
Nkenke aha onyonyo Ụmụaka na okenye pụtara ebe a na-eme ntulịaka

Taoiseach Leo Varadkar, so na ndị kwenyere ka-akagbuo iwu a kwuru na mmeri a ga-abụ ihe a ga-eji maa atụ site eche gawa n'ihu.

Echi ka a ga-akpọpụta aha ndị meriri n'ezie.

McQuirk gakwara n'ihu kwuo na iwu a akagburu pụtara na ndị omeiwu enwere ikike iji hiwe iwu ga-enye ohere ka a na-egbu ụmụaka n'ebe ha. "Anyi agaghị ikwe," o kwuru.