Trump ekwetala ka a kwụsị ikewa ezinaụlọ na-achọ ibanye Amerịka

Donald Trump, Mike Pence na Kirstjen Nielsen bụ onye na-ahụ maka ime obodo Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Ọtụtụ mmadụ katọrọ Trump maka etu ndị ọrụ na-ahụ maka ime obodo jiri na-ekewa ezinaụlọ, ọkachasị umụaka na nne na nna ha

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donlad Trump ebinyela aka n'iwu ọhụrụ ga-ahụ na a kwụsịrị ịnapụ ndị mmadụ gbatara ọsọ ndụ na mba ahụ ụmụ ha.

Iwu a Trump binyere aka ga-ahụ na ezinaụlọ anwụchịkọrọ n'Amerịka ga anọkọ.

Trump sị: "Anyị na-ebinye aka na iwu a. A na m ahụ ya ka iwu dị mkpa. Ọ bụ maka ị hụ na ezinaụlọ nọkọrọ ọnụ, ma hụkwa na oke ala anyị na mba ọzọ siri ike."

Ntụgharị uche a Trump mere bịara ka ụtụtụ ndị mmadụ, ma ndi pati ya, nwụnye ya, ma ndị ofufe na ndị isi mba ọzọ katọrọ nkewa ezinaụlọ a na-eme na mba Amerịka ọkachasị ka ndị ntaakụkọ na egosi ụmụaka na-ebe akwa na ndị ọzọ nọ n'ebe yiri mkpọrọ.

Mana Trump na-ekwu na onweghị ntụghari uche ọbụla ya mere.

"Oke ala anyị ka siri ike etu okwesiri. Mana anyị chọrọ ịhụ na ezinaụlọ nọkọrọ ọnụ," Trump kwuru na ụlọ ọrụ ya, ma sị: "Anyị hapụrụ ezinaụlọ ka ha nọrọ otu ebe."

N'ụtụtụ ụbọchị Juun 20 ka Trump gbara ama na o nwere ihe ya ga-eme maka ọnọdụ ndị nọ na oke Amerịka na Mexico bụ ebe ọtụtụ ndị a na-abata Amerịka si abata. O kwuru si: "M ga-eme ihe ga-akwụsị nkewa a ọsịsọ, bụ nke ndị omeiwu ga etinyekwa aka n'ihu."

Tupu chi efo n'ụbọchi ahụ, Trump nọ na-ekwu na yabụru na ndị omeiwu etinyeghị aka n'okwu ahụ, onweghi ihe ya ga-emenwụ.

Mana ka chị foro ụbọchị Juun 20 ahụ, okwu Trump na-adazị etu ọzọ.

N'ime iwu a o binyere aka, Trump kwuru na ọ bụ echịchị ya ịhụ na ezinaụlọ nọ otu ebe. N'ime nke a, ha ga na-ahapụ ezinaụlọ na otu ọlụ mkpọrọ.

Mana, iwu kwukwara na yabụrụ na a na-atu egwu na ụmụaka enweghị ụdịri nchekwa ha kwesịrị i nwe, a ga-ekewa ha na nne na nna ha.

Isiokwu Ndị Emetụtara