Nna Michael Jackson anwụọla

Otiegwu Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Joe Jackson bụ onye dị afọ 89 nwụrụ n'aka ọrịa Kansa

Akụkọ BBC nwetere kwuru na Joe Jackson anwuola mgbe ọgbara afọ 89 na ụtụtụ tata ka ọrịa Kansa bichara ya aka.

Ọnwụ ya bịachara ka ọgbachara afọ itoolu nwa ya bụ Michael jackson nwuchara.

Akwụkwọ nta akụkọ TMZ buru ụzọ kwupụta nke a.

Nwa nwa ya bụ Taj Jackson kwuputakwara nke a n'akara twitter ya.

Ihe Joe Jackson mere na ndụ ụmụaka ya

Joe Jackson bụ isi sekpụ ntị na ọganihu ụmụaka ya ọkachasị Jackson 5, Michael na Janet Jackson.

Ụmụ ya ise bụ Jackie, Tito, Jermaine, Marlon na Michael bụ ndị amara dịka Jackson 5. Mgbe ụfọdụ ọdụdụ nwa ya bụ Randy na-esokwa ya etiegwu.

Ụmụ ada ya nwaanyi bụkwa LaToya, Rebbie na Janet bụ onye akacha mara n'ime ha buputakwara egwu nke ha.

Ọ bụ eziokwu na ọ bụ Joe Jackson bụ isi afụrụ kwawa okpu maka ọ ga n'ihu ụmụ ya mana ụfọdụ n'ime ha sịrị na o ji akaike chịa ya.

Nke bụ na Michael kwụrụ na ya etoghị ka nwata maka ụdị akaike nna ya ji were zụọ ya.

N'afọ 2003 ka ọ gwara onye nta akụkọ BBC bụ Louis Theroux na ya "n'apịatụ Michael ụtarị mgbe ụfọdụ".

Ya bụ ajụjụ ọnụ agbara Joe Jackson wuru ewu mgbe ahụ maka ihe Joe kwuru. Ọ sị na "anyị anabataghị mmekọ nwoke n'ibe ya. Anyị na ha enweghị mmekọ".

Ezinaụlọ Jackson nwere mgbe ha mechuru onwe ha ihu n'okwu gbasara ike ego nke ruchara ụlọikpe mgbe ụfodụ.

Jermaine Jackson kwukwara na ụfọdụ ndị ezinaụlọ ha enweghị ohere ịhụ nna ha tupu ọ nwụọ dịka akwụkwọ Daily Mail siri dee.

Ọ sịrị, "onweghị onye ma ihe n'emenụ. Anyị ekwesighị ịrịọ arịrọ ịhụ nna anyị ọkachasị n'oge dị otu a".

"Obi mgbawa ji anyị. Agwaghị anyi ebe ọ nọ nke bụ na anyị amaghị ihe n'eme".

Ndụ ya

Amụrụ Jackson na Fountain Hill, Arkansas n'afọ 1928 dịka ọkpara n'ime ụmụ ise ndị ọzọ.

Ọ kọwakwara nna ya nke bụ ọkammụta mahadụ dịka onye ji aka ike azụ ụmụ ya.

Jackson sị bụ na ya chọrọ ị bụ otiọkpọ mana ọ mechara kpọwazịa ụbọakwara jita nke mere ojiri soro ndị otu egwu Falcons nke achịtaghị aja n'egwu.

N'afọ 1949 ka ọ nụrụ Katherine Scruse nke bụ nwa klasị ya na Washington High School na East Chicago dị na Indiana.

Ọ bụ nwaanyị zụrụ ụmụ ha mgbe jackson na arụ ụlọọrụ na-akpụ ụzụ.

Na 1957, katherine mụkwọrọ nwa nke mechaera nwụọ aha ya bụ Brendon.

N'afọ 1960 ka Jackson hụchatara ọnatarachị dị n'aka ụmụ ya were hibe otu egwu Jackson 5 bụ nke Motown Records nabatara n'afọ 1967.

Nwamgbe nta, otu ahụ gbasaa nke mere na Michael bidor otu nke ya.

Mgbe ahụ ka Jackson ji tinye uche n'ada ya nwaanyị bụ Janet nke bidoro mewe nke oma n'egwu.

Jackson kpakwara akaala ya na nwada aha ya bụ Cheryl Terrell nke ọ ji afọ 20 were tọọ.

Cheryl mụtakwaara ya nwa nke iri na otu ya (11) nke ndị afọ iri anọ na atọ (43) ugbua.

Ọ ka jisikwara nwunye ya mbụ bụ Katherine ike nke dị afọ 88 ụgbụa.

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a