Ikpe Nnamdi kanu: Abaribe ọ ga-anọ n'ọchị ka ọbụ akwa taa?

Sịnetọ Eyinnaya Abaribe

Ụlọikpe ukwu nke Binta Nyako nọ n'isi ya nyere iwu n'ikpe o kpere n'ọnwa Maachị afọ 2018, ka onye omeiwu Enyinnaya Abaribe na mmadụ abụọ ndị ọzọ gbaara Nnamdi kanu akaebe kpọta ya ụlọikpe oge a ga-ekpe ikpe ya ọzọ n'ọnwa Juun ma ọ bụ ha agaa mkpọrọ.

Mana Ọkaikpe Nyako nọkwa n'ụlọikpe n'Abuja ụnyaahụ kwụgharịkwa na ha agwala ndị niile gbaara Nnamdi Kanu akaebe ka ha niile bịa ụlọikpe taa maọbụ kwuo ihe mere ha agaghị eji gaa nga ma hapụ ego ha jiri gbaa akaebe.

Aha onyonyo,

Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi.

Ndị gbara aka ebe ahụ bụ Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchite anya ndịda Abịa n'ụlọ omeiwu sineti, onye ụkọchukwu ndị Juu bụ Immanuel El-shalom na otu onye ọzọ bi n'Abuja bụ Tochukwu Uchendu.

Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe maka imegide ọchịchị ala Naijiria, bụ onye a na-achọ achọ kemgbe ọnwa Sepụtemba afọ 2017 ka ndị agha Naijiria wakpochara ụlọ ya oge ha gbara Egwu Eke na mpaghara ọwụwa-anyanwụ Naịjirịa.

Nyako ga-ekpe ikpe ahụ taa n'Abuja ebe a ga-anọ mara ihe ga-eme Abaribe na ndị ọzọ so ya gbaa akaebe ahụ.

Cheta na Abaribe na ndị ọzọ ahụ gbara akaebe ahụ ụbọchị 28 ọnwa Epurel afọ 2017, ma kwe nkwa ịkpọta Kanu n'ụlọikpe maka ikpe ya dịka ha debere ego ruru otu narị nde naịra.

Ndị ọrụ nchekwa DSS nwụchiri Abaribe kamgbe ngwụcha izuụka mana ha ekwughi ihe o mere ha jiri nwụchie ya.

Aha onyonyo,

Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị