A hụla ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha furu kemgbe ụbọchị 9

Foto na-egosi gosiri ụfọdụ ụmụaka ahụ furu efu na onye nchịkọta ha Image copyright Facebook/Ekatol
Nkenke aha onyonyo Foto e tinyere na Facebook gosiri ụfọdụ ụmụaka ahụ furu efu na onye nchịkọta ha

Ihe ọma emeela ka a chọtara ụmụaka iri na abụọ na onye nchịkọta otu egwuregwu ha dabara n'ime ọgba na mba Taịland.

Ndị chọtara ha kwuru na ike ka gwụrụ ụmụaka ndị ahụ, maka ọnọdụ ha nọ n'ime ọgba Tham Luang dị na Chiang Rai kemgbe ụbọchị itoolu e bidoro chọwa ha.

Narongsak Osottanakorn bụ gọvanọ obodo Chiang Rai, kwuru na ọ bụ ndị agha mmiri pụrụ iche chọtara ha, ka mmiri ide kpọbara ha ebe ahụ.

Osottanakorn kwuru sị "Ha niile dị ndụ, mana ọrụ anyị agwụbeghị. Ọrụ anyị bụ ịchọ, zọpụta ma kpọghachita ha azụ, ka o si dị ugbua, anyị achọtala ha. Ọrụ anyị ọzọ bụ isi n'ọgba ahụ kpọpụta ha ma kpọlaa ha n'ụlọ."

O kwukwara sị na ha "ga na-agba mbọ na-awụpụta mmiri dị n'ime ọgba ahụ, ma na-eziga ndị dọkịta na nọọsị ga na-amaba na-enyocha ahụike ụmụaka a na onye nchịkọta ha.

Ọ bụrụ na dọkịta kwuo na ahụ esiela ha ike ọfụma etu e nwere ike iji kpọpụta ha, a ga-akpọpụta ha n'ime ọgba ahụ. Anyị ga-elekọta ha anya ruo oge ha ga-alaghachinwu ụlọakwụkwọ."

Jonathan Pakhead bụ onye ntaakụkọ BBC so na ndị bu ụzọ kwuputa maka nchọta ụmụaka a.

Cheta na ụmụaka ahụ dị afọ site 11 ruo 16, na onye nchịkọta otu egwuregwu bọọlụ ha bụ 'Moo Pa'ha gara ilegharị anya n'ọgba a ụbọchị 23 nke ọnwa Juun.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara