Ụmụaka 12 na onye nchịkọta ha apụtala n'ọgba Thailand

Ụmụaka tọrọ n'ọgba Image copyright Thai Navy

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na ụmụaka iri na abụọ nakwa onye nchịkọta ha apụtala nime ọgba ahụ na mba Thailand.

Ndị ọrụ Navy Seal du ọrụ mgbapụta a, kwuru na a kpọpụtachaala ụmụaka 12 a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba kemgbe izu abụọ.

N'ihe ha dere na Facebook, ha kwuru sị "ụmụaka 12 a e ji 'wild boars' mara na onye nchịkọta ha apụtala n'ime ọgba. Ahụ zuru onye ọbụla oke. Hooyah."

A kpọpụtara ụmụaka asatọ ụnyaahụ, ma kpọpụta ụmụaka anọ, onye nchịkọta ha na otu dọkịta gara inyere ha aka taa.

Cheta na ụmụaka a na onye nchịkọta ha tọrọ n'ime ọgba ụbọchị Juun 23.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekeleela ndị nyere aka ịkpọpụta ụmụaka a.

Ndị otu Manchester United kwuru sị na ha chọrọ ka ụmụaka a na onye nchịkọta ha bịa n'ọgbọ egwuregwu ha ma ha gbakee.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionỊ ga-ahụ ụmụntakịrị ahụ ebe ha na-agwa onye na-egwu mmiri aha ha

Isiokwu Ndị Emetụtara