Friday the 13th: Kedụ nkwenye Ndigbo agbanyeghị ụkwụ na nchọpụta?

Ikwuikwi Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị Igbo na-ahụta ikwuikwi ibe n'abalị ka igosi ọdachi mere ọr ga-eme eme

Ọtụtụ ndị kwenyere na ụbọchị ọbụla Fraịde danyere n'ụbọchị 13 n'ọnwa bụ ụbọchị ihe ọjọọ dị iche iche na-eme, mana ọ bụ eziokwu?

E nweghị onye ma etu nkwenkwe agbadoghị ụkwụ na nyocha nke Bekee kpọrọ 'superstition' nke ụbọchị Fraịde si bido, mana ọtụtụ ndị kwenyere na ya.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe kpatara Fraịde danyere n'ụbọchị 13 ji bụrụ ihe a na-ahụ ọjọọ sitere n'akwụkwọ nsọ; maka na Judas bụ onye mere e ji kpụrụ Jesus Kraịst, bụ onye 13 nọdụrụ ala iri nri ikpeazụ Kraịst na ndị ụmụazụ ya riri nke Bekee kpọrọ 'Last Supper'.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwenyere na ihe ọjọọ dịka mmerụ ahụ na ụfọdụ oge ọnwụ, bụ ụdịrị ọdachi na-eme maka ụbọchị a.

Ụfọdụ ụlọ oriri na nkwari dị na mba ofesi na-eji maka ụjọ ghara inwe ọnụ ụlọ a kpọrọ 13, ụfọdụ ụlọ ogologo anaghị enwe 13, ebe ụfọdụ ụgbọelu anaghị ekwe etinye 'row 13' n'ụgbọelu ha.

N'ala Igbo ọ nwere ihe ahịma maọbụ ihe nrụbaama na-eyi ndị Igbo egwu ma ha mee.

Ụfọdụ ha bụ ndị a:

!. Ikwuikwi ibe n'abalị

Ikwuikwi bu otu nnụnụ anaghị ele anya ọma n'ala Igbo.

O bee n'abalị, a na-ewe na ọ na-egosi ọnwụ mmadụ maọbụ ọdachi ndị ọzọ.

2. Egbeigwe ịgba ma mmiri anaghị izo

Image copyright Getty Images

A na-ewe ya ka oke odachị emeela maọbụ ọ chọrọ ime na ọ bụrụ na egbeigwe gbara na na enwehị mmiri ọbụla zoro.'obo na nke a mee.

3. Chi iji ehihe ji

Chi iji ehihie ji( sunset at dawn) na-egosi oke ihe dịka ọnwụ oke mmadụ, ọnwụ okorobịa.

4. Ikpo ụkwụ aka ekpe na mbido njem

N'ọdịnala Igbo a na-ahụ mmadụ ịkpọ ụkwụaka ekpe na mbido njem dịka ama ihe ọjo ga-eme.

Ụkwụ aka eke kpọọ onye nwere nkwenye a, ọ ga-alọghachi be ya, hapụ njem ọ kwadoro

Ikekwe ọ bụrụ mgbaama ihe mberede okporoụzọ maọbụ ije onye ahụ agaghị enwe isi.

Ị ma na afọ 'leap year' nwere Fraịde 13 atọ?

Afọ niile na-enwerịrị otu 'ụbọchị Fraịde 13', ụfọdụ na-enwekarị otu ọkachasị afọ bụ 'leap year'.

Bekee kpọrọ ụjọ Fraịde 13 'paraskevidekatriaphobia.'.

Ndị BBC One dere ihe ọ dị ka ya ma ị nọrọ n'ụlọ naanị gị ma nụ mkpọtụ.

Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ya

Ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ ụjọ ime ụfọdụ ihe ụbọchị ọbụla Fraịde manyere na 13 nke ọnwa ọbụla.

Ụfọdụ na-agbachido onwe ha n'ime ụlọ ka ha nwee ike ghara ịdabanye n'ihe ọjọọ ha na-eche ga-eme ụbọchị ahụ, ebe ndị ọzọ na-agara onwe ha na-atụfughị uche maka ihe ọjọọ ọbụla.

@RogerCraigSmith kwuru sị "asala ahụ, awala nkụ, agala chọpụta 'ihe bụ mkpọtụ ahụ'...nọrọ n'ụlọ lee ihe nkiri na-atụ ụjọ."

@BeverleyTemplem kwuru na o nwere ike ịbụ Fraịde 13 mere Instagram anaghị arụ ọrụ ugbua.

@WoodGreenAndy kwuru na ụbọchị a gara were were n'ebe ọ nọ.

@Akn3773Stanton na-ekele ndị mmadụ

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara