Fidelity Bank: Ndị na-eme ngagharị iwe abụghị ndị ọrụ anyị

Fidelity Bank

Ụlọakụ Fidelity agọọla na ndị mere ngharịiwe n'ụlọọrụ ha bụ ndị ọkwọụgbọala ndị ha na-ha na-arụkọ chụrụ n'ọrụ.

Ndị ọrụ n'ụlọakụ Fidelity mere ngagharịiwe ụbọchị Tuzde n'ụlọọrụ ha dịgasị na Legos iji gosi iwe ha n'ihi akwụghị ụgwọ ọnwa nakwa ọnọdụ ọrụ ha nke ha kwuru na ọ tara ọjị anya.

Ndị ọrụ ahụ bucha akwụkwọ na-egosi iwe ha gụnyere; 'Kwụọ anyị oke ruru anyị' 'Fidelity Bank, anyị rụtara ego a'; 'obi ọjọọ a akarịala.'

Na ozi nke onyeisi ngalaba mgbasaozi n'ụlọakụ ahụ bụ Charles Aigbe binyere aka, ụlọakụ ahụ kwuru na ndị mere ngagharịwe ahụ bụ ndị ọkwọ ụgbọala ndị ụlọ ọrụ ha na ha na-arụkọ chụrụ n'ọrụ.

Ụlọakụ ahụ kwuru na "ndị ọkwọụgbọala ndị otu ụlọọrụ ha zitere anyị ka ha rụọrọ anyị ọrụ n'oge gara aga.

"Iji mee ka okwu a doo anya, anyị na-ekwusi ike na Fidelity Bank ejighị ndịọrụ ụgwọ ọnwa maọbụ ụgwọ ruru onye a chụrụ n'ọrụ. "

Image copyright Fidelity Bank

Fidelity Bank boro ebubo na ebumnobi ndị mere ngagharị iwe ahụ bụ ibute mgbochi nye ndị chọrọ iweta maọbụ tinye ego n'ụlọakụ ha.

Ha gara n'ihu kwuo na ha ga-agba ndị a na-eme ngharịiwe akwụkwọ n'ụlọikpe.

"Anyị bụ ụlọakụ mara ọrụ dịrị ya ma na-agbasokwa iwu ala Naijiria. Dịka anyị anaghị emegide ndị mmadụ ịgbakọ, ihe ha mere bụ ihe ekwesighị ekwesi.

"Anyị ga-agba ha akwụkwọ n'ụloikpe iji kwụsi mmekpa ahụ a."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara