Nipsey Hussle: Ihe iri mere ọnwụ ya ji ewu

Nipsey Hussle Image copyright David Crotty
Nkenke aha onyonyo A họpụtara egwu ya dịka egwu kachasị enwe mbem n'ituruugo nke 'Grammy' afọ a.

Ụwa niile kpụ Nipsey Hussle n'ọnụ n'ihi ọnwụ mberede zutere ya n'oge ndị oji egbe gbagburu ya n'ụbọchịụka n'ihu ụlọahịa ya dị na Los Angeles mba Amerịka.

Akụkọ kwuru na a gbara Hussle ọnụ egbe ugboro isii n'ihu ọdọahịa ya.

E buru ya gaa n'ụlọọgwụ ebe e kwupụtara na ọ nwụọla.

E merụkwara mmadụ abụọ ọzọ ahụ dịka ndị ọrụ nchekwa jiri kwuo.

Ọnwụ ya Nipsey Hussle butere oke akpata oyi n'ahụ ọtụtụ ndị mmadụ dịka ndị ama ama n'iti egwu n'ụwa gọsipụtara nwute ha n'akara Twitter.

Rihanna kwuru na mmụọ ya na-ama jijiji n'ihi ọnwụ Nipsey:

Pharrell Williams kwuru na Nipsey bụ oke ike kwalitere mmụọ ọtụtụ ndị mmadụ:

Miguel kwuru Nipsey nwere ọtụtụ ihe oji n'aka ọ na-arụ tupu ọnwụ ya

Onye bụ Nipsey Hussle? Gịnị mere ọnwụ ya jị ewu?

1. Ihe kachasị mee ọnwụ Nipsey ji ewu bụ ebubo ụfọdụ na-ebo n'ọnwụ ya gbasara akụkọ ọ na-akwado ịkọwapụta maka otu nwoke kwuru na ya enwetala ọgwụgwọ ọrịa mminwụ (AIDS).

Nwoke ahụ a kpọrọ Dr Sebi nwụrụ n'ụzọ edoghị anya n'ụlọmkpọrọ.

2. Ezigbote aha ya bụ Ermias Davidson Asghedom, a mụrụ ya n'abalị iri na ise ọnwa Ọgọsụtụ afọ 1985.

3. Ọ na-ede ma na-eti egwu, o si n'obodo Los Angeles nke mba Amerịka.

4. Ọ malitere iti egwu na gburu gburu afọ 2000, ebe o tiri egwu ndị dịka 'The Marathon', 'Crenshaw' na ndị ọzọ.

5. A họpụtara egwu ya dịka egwu kachasị enwe mbem n'ituruugo nke 'Grammy' afọ a.

6. Nipsey Hussle mụtara ụmụ abụọ n'aka ụmụnwaanyị abụọ, Lauren London n'afọ 2016 nakwa Emani.

7. A mara Nipsey dịka onye na-achụnta ego, o nwere ebe ọ na-ere akwa a kpọrọ 'Marathon Clothing'.

8. Ọtụtụ ndị mmadụ na-ahụta Nipsey dịka onye na e nyere ndị mmadụ aka n'obodo ya nakwa ebe ndị ọzọ.

9. Otu onye na ndị na-eche na e gburu Nipsey ,maka ọrụ o ji n'aka ekwuola na ya ga-arụtọpụ ọrụ ahụ

10. Ndị uweojii ji ike achọ onye gburu Nipsey.

Mana nkọwa ndị uweojii na onye ha na-achọ bụ 'nwoke isii ojii' were ọtụtụ iwe.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara