Poland: Nwaanyị ejirila ejima 6 mujuo ụlọ

Nwa ọhụrụ Image copyright AFP/GETTYIMAGES
Nkenke aha onyonyo Ihe a bụ mgbe mbụ a na-amụ udiri ejima a na mba Poland

Nwaanyị dị afọ iri abụọ na itoolu amụọla ejima isii na mba Poland dịka ndị dịbia bekee na ndị ọrụ ahụike nọ na ụlọọgwụ Kakrow si depụta.

Ejima a gụnyere nwa nwoke abụọ na nwa nwaanyị anọ.

Ihe mere ọmụmụ a ji dị iche

  • Nke a bụ mgbe mbụ a na-amụ udiri ejima na mba Poland mabụrụkwa ole ole na mbaụwa niile dịka ọkammụta Ryzszard Lauterbach si kwuo.
  • A wara nne ha afọ kụpụta ụmụ ejima a
  • Onyeisiala zitere nne ha ụkpa ekele aṅụrị
  • Ndị dọkịnta kwuru na ihe a bụ ihe iribama
  • Otu n'ime afọ ime ijeri ise na-ebute ejima isii kwuru

Dịka dibia bekee si kwuo, nne ejima isii a gbasiri ike ma na-enweri aṅụrị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: