Onye ọkammụta na Russia kwenyere na ya gburu mmadụ ka a hụrụ aka nwaanyị n'ime akpa ya

Oleg Sokolov ka o jikere ka ndị agha Rọshịa na-adị n'afọ 1812 Image copyright EPA
Nkenke aha onyonyo Oleg Sokolov ka o jikere ka ndị agha Rọshịa na-adị n'afọ 1812

Otu onye ọkammụta a ma ama na mba Rọshịa ekwenyela na o gburu ọchụ.

Nwoke a bụ Oleg Sokolov dị afọ 63 gburu enyi ya nwaanyị, onye bụbụ nwata akwụkwọ ya.

Ọ bụ n'ime mmiri ka a hụrụ Maazị Sokolov ka o bu akpa ebe aka nwaanyị egbubiri egbubi dị n'ime ya.

Dịka akụkọ siri kwuo, manya na-egbu Sokolov mgbe a hụrụ ya ka ọ na-achọ itufu akpa ozu mmadu dị n'ime ya.

Ndị uweojii mechara hụụ ozu Anastasia Yeshchenko dị afọ 24 n'ụlọ Sokolov, ebe gburichara ya egburi.

Ọkammụta Sokolov bụ onye e ji amamihe banyere onye chịbụru mba Frans mgbe gboo bụ Napoleon mara.

Mba Frans enyela Ọkammụta Sokolov nturugo ha a kpọrọ 'Légion d'Honneur'.

Ọkaiwu ya gwara ụlọ ntaakụkọ AFP na o kwenyere na o ikpe mara ya, ma na-aza ajụjụ dị n'ime ya.

Akụkọ na-ekwu na nwoke a gburu enyi ya nwaanyị ka ha na-arụrịtaụka ma were mma nwere eze a kpọrọ 'Saw" kwọpụ ya isi, aka nakwa ụkwụ.

Ọ sị na ọ chọrọ iji nwaayọọ tufucha anụ ahụ nwaagbọghọ ahu yupu o gbuo onwe ya.

Isiokwu Ndị Emetụtara