International Women's Day: Onweghị ihe ọbụla nwaanyị agaghị emenwu - Nwaanyị Nigeria na-arụ na NASA

Ọtụtụ ọrụ dị icheiche dịka Njinia, bụ nke ọtụtụ mmadụ na-ahụta dịka ọrụ ụmụnwoke.

Mana Wendy Awele Okolo, e gosila na onweghị ihe nwoke mere nwaanyị agaghị enwe ike ime.

Awele bụ ihe ndị Bekee kpọrọ 'Aerospace Engineer'.

Ọ na-arụ ọrụ n'ụlọorụ 'National Aeronautics and Space Administration' nke mba Amerịka

Dịka a na-eme emume ncheta ụmụnwaanyị n'ụwa niile taa, Awele kọọrọ BBC Igbo etu njem ya si malite.

Kirie ya n'uju.

Ndị mepụtara ihe nkiri a bụ Chimamaka Ihenacho na Vining Ogu.