BBC IGBO: Mgbasa ozi ọhụrụ na-akwado mmalite

Peter Okwocha Image copyright Channels TV
Nkenke aha onyonyo Peter Okwocha sokwa na ndị na-akwado mgbasa ozi ọhụrụ nke a

Ndị ntaakụkọ BBC na-akwado mmalite mgbasa ozi ọhụrụ n'asụsụ abụọ bụ Igbo na Yoruba n'ubọchị Eke (Monday) bụ Febụwarị 19.

Ọnụ na kwuchitere BBC na Naịjirịa bụ Peter Okwoche kwuru na mgbasa ozi ọhụrụ nke a ga-emetuta ndị mmadụ ọhụrụ.

O kwuru nke a oge ọ pụtara n'ihe nkịrị ụlọ ntaakụkọ Channels a kpọrọ 'Sunrise'

Ugbua, BBC na-agbasa ozi na Bekee, Hausa na Pidgin n'ala Naịjirịa.

Okwocha kwuru, "Anyị na-eme ihe a maka ikwalite asụsụ Igbo. Nchọpụta UNESCO mere gosiri na-asụsụ Igbo na anyụ ka ọkụ."

"Echiche anyị bụ n'asụsụ Igbo ga-aputa ọfụma ofụma"

Kedu ihe bụ olileanya BBC Igbo?

Nkenke aha onyonyo BBC Igbo
  • Akụkọ maka ihe na-eme na ala ndi igbo
  • Akụkọ maka omenaala
  • Akụkọ na-eme na mba ndị ọzọ
  • Ihe gbasara umunwanyi na ndị na-etoto

BBC na-agbasa ozi n'asụsụ dị icheiche ihe karịrị iri atọ n'ụwa niile.

Isiokwu Ndị Emetụtara