Winter Olympics: Onye ikpeazu Simisola Adeagbo ekwuola obi ya

Simidele Adeagbo Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Simidele Adeagbo mgbe nkwado ya n'asọmpị nke a

Onye Naịjirịa bụkwa onye egwuregwu skeleton n'asọmpị gbasara oyi (Winter Olympics) bụ Simidele Adeagbo ekwuola na obi tọrọ ya ụtọ na agbanyeghị na ya pụtara dịka onye ikpeazụ n'asọmpị n'egwuregwu Skeleton.

Simidele Adeagbo kwuru na "Ọ hịara ezigbo ahụ onye ọbụla iji ọnwa anọ mee nkwado maka asọmpị Skeleton dịka m siri mee."

"A na-eji ọtụtụ afọ amụta egwuregwu skeleton.

Onye ala Britain bụ Lizzy Yarnold bụ onye nke mbụ n'egwuregwu ahụ.

Adeagbo kwukwara na iso n'asọmpị Winter Olympics nke afọ bụ ihe kachasị ya mkpa.

Ọ kwara ndị ntaakụkọ na "Ọ bụ ọnwa isi gara aga ka m bidoro ịmụ egwuregwu Skeleton. Echiche m bụ ịkpalite obi ọtụtụ ndị ntorobịa na ndị ụmụagbọgbọ bi na Naịjirịa ka ha bido nkwado nke a ngwangwa."

Adeagbo kwuru,"Onweghị ihe ọbụla dị n'uwa anagha enwe ike ị mere."

Isiokwu Ndị Emetụtara