Iko FA: Man United emeriela Huddersfeild na asọmpị kpụ ọkụ

Romelu Lukaku Image copyright Reuters
Nkenke aha onyonyo Romelu Lukaku enyela goolu karịrị iri abụọ n’asọmpị dị icheiche n’afọ anọ garaaga

Manchester United emeriela Huddersfeild n'asọmpị iko FA n'ụbọchị Satọdee.

Ha nyere ha ọkpụ abụọ ana asataghị otu.

Romelu Lukaku bụ onye nyere goolu nke mbụ n'nkeji atọ.

Goolu nke abụọ batara na nkeji iri ise na ise.

Manchester United ji mmerị nke a bata na agba nke atọ tupu nke ikpeazu.

Lukaku bụ onye ala Belgium enyeela goolu nke iri abụọ na otu asọmpị nke a.

Manchester United na-enwe olileanya na ha ga-emerị asọmpị iko FA n'afọ a.

Ọ bụrụ na ha merie asọmpị nke a, ọ ga-abụ ugboro iri na atọ ha meri yabụ iko.

Isiokwu Ndị Emetụtara