Ụgbọelu bu mmadụ 60 akpọkasịala na Iran

Ụgbọelu ndị Aseman Airlines Image copyright KONSTANTIN VON WEDELSTAEDT
Nkenke aha onyonyo Aseman Airlines na-elekọta ụgbọelu ATR 72-500

Ụgbọelu bu ihe ruru mmadụ 16 a kpọkasịala n'ebe ugwu dị na sentral Iran, dịka ntaakụkọ kwuru.

Ụgbọelu a dara n'ugwu Zagros dị nso obodo Semirom dị na mpaghara Isfahan, ka ọ na-efe n'etiti Tehran na ọdịda-anyanwụ obodo Yasuj, dịka akụkọ kwuru.

"Ndị ọrụ gbatagbata niile mụ anya na-eche" otu ọnụ na-ekwuchitere ndị ọrụ gbatagbata kwuru. "Ụgbọelu ahụ bu ndị njem ruru 50 maọbụ 60."

Akụkọ kwuru sị na ọ bụ ihuigwe ọjọọ gbochiri helịkọpta ndị gbatagbata ịgaru ebe ahụ.

Ọ bụ ndị Aseman Airlines nwe ụgbọelu ahụ a sị na ọ bụ ATR 72-500.

Akụkọ kwuru sị na ndị njem 60, ndị nchekwa abụọ, ndị na-elekọta ndị njem n'ụgbọelu abụọ nakwa mmadụ abụọ na-anya ụgbọelu.

Mmadụ niile nọ na ụgbọelu a anwụrụ.

Isiokwu Ndị Emetụtara