Ibrahim Idris nwere ike ịza ajụjụ n'aka Buhari

Ibrahim Idris Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na ndị agha enwebeghị ike ịkwusị ogbugbu mmadụ na Benue steeti

Obi mebiri ọtụtụ ndị mmadụ oge onyeisiala Naịjirịa bụ Mohammadu Buhari kwuru na ọ tụrụ ya n'anya na aka na-achị ndị uweojii bụ Ibrahim Idris nupuru isi n'iwu o nyere ya.

Buhari gwara Idris ka o biri na Benue ruo mgbe a ga-akwụsị igbu mmadụ na steeti ahụ.

Mana Idris nọrọ na Benue nanị mkpụrụ ụbọchị ole na ole tupu ọ laghachị Abuja.

Na nleta Buhari biara ịleta ndị Benue ụnyaahụ, o kwuru na o juru ya anya na Idris mere ụdịrị ihe a.

Mana ndị okachamara BBC kpọrọ n'elu ekwentị kwuru na ọ rara ahụ ikweta na onyeisiala obodo amaghị ebe onyeisi ndị uweojii nọ mgbe niile, maọbụ ebe ọ nọ arụ ọrụ.

Larry Oguego bụ onye ọkachamara gwara BBC Igbo na ọ bụ ihe ihere na ihe a na-eme na Naịjirịa.

O kwuru sị "n'uche m onyeisiala anyị maara na Idris anọghị na Benue, ihe eji sị Idris gawa Benue n'oge mbụ bụ maka mkpu ndị Naịjirịa na-eti."

Gee n'uju ihe ọkammụta Larry Oguego kwuru maka okwu nke a.

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionIhe Buhari kwesiri ime IGP

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a