Anwụlụ na oke isi achụọla ndị mmadụ ọsọ

Ebe ha na-etufu ahịhịa Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Awụlụ si ebe a ana-etufu ahịhịa na-ebute nnukwu ọrịa

Ndị bịrị na mpaghara Ikosi, Isheri ma ọ bụ Ketu na Lagos steetị na-aṅụ ajọ ịsị si n'ebe ndị gọọmentị na-aga itufu ahịhịa a kpọrọ Olososun dumpsite n'Ojota.

Enugu Steeti nwere nke a ha n'okpokoro ụzọ awara awara si Enugwu ga Port Harcourt.

Ajọ isi n'apụta n'ebe ndị a ka nkụ nke nke na Lagos, ụfọdụ ndị bị n'ebe a akwapugo n'ihi oke isi.

Na Lagos, akụkọ kwuru na otu nwata nwụrụ makana onweghị ike iku ume n'ihi na anwụlụ sị ebe a juputara ebe niile.

Maka ihe a, Gọvanọ Lagos bụ Akinwunmi Ambode emechiela ebe a ana-atufu ahịhịa.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Gọọmentị na ndị obodo na-agba ebe ahịhịa okụ oge ọbụla

Ihe ndị mmadụ na-ekwu

Mana oke isi ahụ ka dịkwa nakwa ndị mmadụ biri na-ebe a.

BBC Igbo kpọrọ otu nwoke akpọrọ Samuel Osaze bị bụ ebe a n'elu ekwentị.

O kwuru na awụlụ na-esi ebe a na-apụta bụ ihe na-bute nnukwu ọrịa.

"Awụlụ a na-apụta makana gọọmentị na-agba ebe a ọkụ oge ọbụla. Ụnyahụ mgbe m nsị okporo ụzọ ịkọsị na-aga be m, nnukwu awụlụ juputara ebe niile n'ebe ahịhịa a"

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo N'afọ 2013 otu na-ahu maka ịtufu ahịhịa na Lagos bụ Lagos Waste Management Agency LAWMA kwuru na ahịhịa Lagos ruru tonnes puku iri na atọ

Otu dibia bekee, Dkta Ikechukwu Mgbolu kwuru na anwụlụ si ebe a na-etufu ahịhịa na-ebute ọrịa dị iche iche dịka ọnyụnyụ na ọgbụgbọ (Cholera), Taifọd, ịba(malaria) na lasa fiva.

O kwukwara na ndị nwere ọrịa ashịma(asthma) anaghị enwe ike ibi nso ụdị ebe a.

Mgbolu kwuru:"Nnukwu anwụrụ a na-ebụte ọrịa ngụgụ elu nke a kpọrọ 'upper respiratory infection' na bekee nihi ajọ ikuku kabọn monozide dị n'ime anwụlụ."

Osaze kwuru na isi a a na-ekweghizi edi n'etiti ọnwa Maachị na Ọgụsụtụ afọ niile maka oge a bụ oge udummiri.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị biri na Lagos na-etufu ahịhịa oge ọbụla n'okporo ụzọ na Lagos

Osaze kwuru, "Onweghị obodo ndị mepere anya na-agba ebe a na-etufu ahịhịa ọkụ ugbua makana ha mara na omume dị otu a na-ebute nnukwu orịa.

"Gọọmentị kwesịrị ịzụ ihe a akpọrọ incinerator na bekee bụ igwe eji agba ahịhịa ọkụ."

Gọvanọ Ambode ekwuola na agaghị na-atụfu ahịhịa ọbụla ebe ahụ ọzọ maka ọrịa di iche iche ọ na-ebuta.

Ọ dị zị ndị steetị ndị ọzọ n'aka ikwu ihe ha ga-eme ebe ntufu ahịhịa dị n'etiti obodo ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: