Ị ma agwọ abacha?

  • Chioma Nkemdilim
  • Senior Broadcast Journalist, Igbo Service
Abacha

Ebe foto si, 9jaDelicacies/Instagram

Nkọwa foto,

Abacha bụ nrị e jiri mara ndị Enugwu steetị

Abacha bụ nrị na-amasị ndị mmadụ niile rịrị ya nke ukwuu. Nrị a sitere n'aka ndị Igbo, mana ọ bụ ndị Enugwu steeti ka e ji ya mara.

A na-eji abacha kpọrọ nkụ maọbụ nke mmiri eme ya. Abacha a si n'akpụ.

E sịchaa ya n'ọkụ, e be ya kịrịkịrị. Eme chaa, etinye akpụ a na mmịrị oyi, ebe ọ ga-adị chi wee foo. Asaachaa ya, agbaa ya n'anwụ maobụ ya etu a dịka ụdịrị nke akpọrọ abacha mmiri.

Abacha agwọrọagwọ anaghị afịa ahụ ị mụta. Lee ka esi eme ya (mana, amatakwa na obodo di icheiche nwere etu ha si eme nke ha).

Ihe ị ga-eji agwọ ya:

  • Mmanụ nri
  • Ugba/Ukpaka
  • Nnu
  • Oporo akwọrọ akwọ
  • Ose na yabasị
  • Aṅara a sara asa/akwụkwọ aṅara e biri ebi (ma ị chọọ)
  • Akwụkwọ ụtazị e biri ebi (ma ị chọọ)
  • Mkpụrụ ehu akwọrọ akwọ
  • Ogiri (ma ị chọọ)
  • Akanwụ
  • Abacha kpọrọ nkụ/ maọbụ nke mmiri
  • Azụ (nke ọbụla ị chọrọ)
  • Ngwa nrị ndị ọzọ.
E si n'akpụ enweta abacha
Nkọwa foto,

E si n'akpụ enweta abacha

Etu esi agwọ ya

Abacha n'atọ ụtọ sitere n'ihe dị icheiche etinyere na ya. Ị ga-eso usoro obere obere ka ị nweta ihe ị chọrọ.

Ka anyị bido.

  • Tinye abacha gị na mmịrị dịtụ ọkụ, chere ka nkejị atọ gaa, wụnye ya na myọ, dosaa ya n'efere
  • Wunye mmanụ nri n'ite. Tinye akanwu. Kpaghaa ya nke ọma ka ọ ghọrọ ncha. Tinye ehu ma ị chọọ
  • Tinye oporo, ose, ngwa nrị na yabasị (tinye ụgba na ogiri ma ị chọọ). Kpagharịa ha niile ọnụ
  • Tinye abacha n'ite gwakọrita ha niile ọnụ
  • Tinye nnu maọbụ na ngwa nri ga ezu ya
  • Sie ya nwobere oge (ntabi anya ise/iri) n'ọkụ ma ị chọọ ka ọ dị ọkụ
  • Nrị eghego!
  • Kunye nrị a n'efere, tinye ụtazị, aṅara/akwụkwọ aṅara, azụ, anụ na ihe ndị ọzọ ka i siri chọọ.

Onwekwara etu ozọ esi esi ya bu nrị

  • Weta akanwu. Tinye ya n'efere, tinye otu iko mmịrị jụrụ oyi. Kpagha ya ọfụma
  • Tinye manụ, kpagha ya rue mgbe ọgbara ụfụfụ
  • Tinye abacha n'ime ya, bido ịgwọ ya
  • Na entiye mmiri etu ị si chọ
  • Kunye ya n'efere wee kwanye ya azụ, anụ ewu/ehi, kanda maọbụ okporoko na ihe ndị ọzọ chọọ ya mma
  • Ọ bụrụ azụ ndụ, ghee ya eghee maọbụ mịa ya n'ọkụ
  • Ọ bụrụ okporoko maọbụ azụ kpọrọ nkụ, tinye ya na mmịrị ọkụ, wepukwa ọkpụkpụ dị na azụ ahu.
Jiri ihe ọbụla ị chọrọ rie ya

Ebe foto si, IdjsKitchen/Instagram

Nkọwa foto,

Jiri ihe ọbụla ị chọrọ rie ya

Rie nrị gị, hichaa ọnụ. Ṅụọ nkwọ ọcha. Ị ga-ekwe n'ịsị maka ọ ga-adị ụtọ!

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ga-amasị gị

Akara ntụ-ntụ