Akụkọ kachasi n'ụtụtụ a: Lasa abaala steeti iri abụọ ma gbuo ọtụtụ mmadụ
Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a:
Iba Lasa abaala steeti iri abụọ
Ngalaba na-ahụ maka ịkwụsị mgbasa ọrịa dị icheiche n'ala Naịjịrịa bụ Nigeria Centre for Disease Control na bekee ekwuola na iba Lasa abaala steeti iri abụọ na Naịjirịa ma gbuo mmadụ ruru otu narị na abụọ.
Ebe foto si, Getty Images
Ha kwukwara na ugbua mmadụ narị anọ bụ ndị nwere iba ahụ.
Ndị uweojii n'Enugwu na-achọ nwoke gburu nwa ya
Ndị uweojii n'Enugu steeti ekwuola na ha na-achọ otu nwoke akpọrọ Onyenwe Offor Ajah bu nna gburu nwa ya a kpọrọ Kenneth Ajah.
Ha kwuru na mkpamkpa mere n'obodo Ameke Enu n'ime Oduma na Aninri Local Government na Enugu steeti.
Ndị uweojii kwuru na Onyenwe gburu nwa ya dị afọ iri atọ na asatọ maka esemoku ha nwere.
N'akụkọ Afrịka
Julius Maada Bio bụ onyeisiala ọhụrụ ala Sierra Leone
Ebe foto si, Getty Images
Ala Sierra Leone enweela onyeisiala ọhụrụ.
E duru Julius Maada Bio iyi ọrụ dịka onyeisiala ahụ
O meri Samura Kamara na mmetọpu ntuliaka ha mere n'abali ise gara aga.
N'egwuregwu
Ebe foto si, Getty Images
Enyinmba agaala ala Saut Afịrịka maka asọmpị iko CAF Confederation Cup nke agba iri na isi.
Ha na Bidvest Wits ga-asọ mpi n'ọgbọ egwuregwu Milpark n'ime Johannesburg echi bụ ụbọchị isi n'ọnwa Epureel.
N'asọmpị Champions League
Liverpool meriri Man City ọkpụ atọ na asaghị ihe
Barcelona merikwara Roma ọkpụ anọ mana ha sataha otu
Gere akụkọ mere taa n'otu nkeji
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile