NPFL: Rangers na Rivers United enweela mmeri

Ebe foto si, Rangers FC
Rangers buru iko NPFL n'afọ 2016
Otu egwuregwu Rangers United emeriela Yobe stars n'asọmpị NPFL n'aha ichafu ọkpụ atọ na asaghị ihe.
Ajani Ibrahim bụ onye nyere goolu abụọ, na nkeji iri ise na iri na iri anọ na atọ, Bright Silas nyere goolu nke atọ na nkeji iri asatọ na ise.
Onye nkuzi ha bụ Olugbenga Ogunbote kwuru na "ugbua, anyi na-eji nwayọ na-eru ebe anyi chọrọ iru n'asọmpi a."
Mohammed Baba Ganaru bu onye nkuzi Yobe Desert Stars kwuru na ha mere nnukwu mmehi n'asọmpị a.
N'akụkọ yiri ibe ya, Rivers United meriri Heartland FC nke Owere ọkpụ atọ na asataghị ihe.
Ebe foto si, Heartland FC Facebook
Ugbua Heartland ka so n'otu a nwere ike ị gbapụ n'asọmpị NPFL
Emeka Ogbugh na Roland kofi bu ndị nyere goolu n'asọmpị a.
Onye nkuzi Heartland bụ Ezekiel Onyegbule kwuru na mmeri ha bụ maka na e wepuru obi ha na yabụ asọmpị.
Ugbua, Rivers United bụ ndị nke iri n'akara. Heartland na Aba Warriors ga-asọmpị n'ubọchị uka na Dan Anyiam Stadium n'ime Owere.