Udo ka na-akọ na Kogi steeti

Ndị uwe ojii Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-ekwe nkwa na ihe a anaghị eme ọzọ na Kogi

Ugbua abụghị oge kachasị mma n'ihe gbasara udo na Kogi steeti maka ọtụtụ mmadụ ndị jiri egbe na-egbu na steeti ahụ.

Ụnyahụ ndị jii egbe gburu ndị uweojii abụọ n'ụlọọrụ ha n'obodo Gegu na Kogi steeti.

Mkpamkpa a na-eso ihe mere n'ụbọchị iri abụọ na asatọ n'ime ọnwa Maachị hụrụ mmadụ isi gbanahụchara ndị uweojii na steeti ahụ.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchiri ndị uweoji na Kano steetị bụ Abubakar Aminn Sadiq n'elu ekwentị, o kwuru na ihe a na-eme na Kogi steeti anaghị enwe ike ime na Kano maka nkwadebe ndị uweojii mere na steeti ahụ.

O kwuru na "ụlọọrụ anyị na Kano steeti nwere ihe osise n'ebe niile na-ahụ mmadụ ọbụla na-abata ma pụọ n'ụlọọrụ anyị."

O kwukwara na ndị otu ya dị njikere n'ọrụ ya.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Egwu ka dị n'obi ndị biri n'obodo di icheiche na Kogi maka ndị jii egbe n'egbu ndị mmadụ

Mpu na aghghọ

Mana otu onye okachamara na n'ihe gbasara nchekwa obodo bụ Emeka Monye kwuru ihe ole na ole mmere ihe a n'eme na Kogi steeti.

Na nke mbụ, o kwuru na ọtụtụ n'ime ndị uweojii a na ndị a nupu isi n'iwu na-ejikọ aka n'aka. Na ndị uweojii na-ana ha aka azụ

O kwukwara na ndọrọndọrọ ọchịchị na Kogi steeti so kwa na ndị na-ebute nsogbu n'obodo a. Na nsogbu dị n'etiti gọvanọ steetị ahụ bụ Yahaya Bello na Sịnetọ Dino Milaye so na ihe na-ebute nsogbu na steetị ahụ.

N'ọnụ okwu ya: "ụlọọrụ ndị uweojii ọbụla mara ihe a kwesiri ime maka ị che onwe ha. Ihe na eme na Kogi bu ihe ama ama eme. Ọ dị njọ makana ọ bụ ndị nkịtị ga-ata ahụhụ dị na ya"

Akụkọ ga-amasị gị:

Isiokwu Ndị Emetụtara