Mwakpo ndị ọchịehi:Ọ bụ okwute ka ga-akwụsị ha?

Onye na-ama okwute Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Ọ bụ ịma okwute ka ndị bi na Benue ga eji zọọ onwe ha?

Ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na okwu nchekwa ala anyị bụsị onye-zọba-isi onwe ya.

Okwu so akụkọ si na ụlọọrụ Punch kwuru na Gọvanọ Samuel Ortom nke Benue steeti ekwuru ka ndị gbara ọsọ ndụ na Benue bidoro iji okwute na-azọ ndụ ha n'aka ndị ọchịehi ji egbe n'ihi na ndị agha adịghị njikere ịzọ ha.

Ha dere na Ortom kwuru na ha kwesiri ịnwe njikere dịka David siri buso Goliati ọgwụ dịka akwụkwọ nsọ sịrị kwuo.

BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuchiri ndị uweojii na Benue steeti bụ Joel Yamu n'elu ekwe ntị maka echiche ha gbasara udi okwu a. Mana o kwuru na-anubeghị ụdị okwu a n'ọnụ Ortom.

Mana ọtụtụ mmadụ n'oge garaaga ekwuola na sọọsọ omume a ga-akwụsị ndị ọchịehi jiri egbe na-egbu ndị mmadụ.

'Okwu a enweghị isi'

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Samuel Ortom na ndị uweojii enweela nghọtaghe n'oge garaaga

Michael Gotep biri na mpaghara ebe a nsogbu a dị gwara BBC Igbo na okwu a Ortom kwuru gosiri na nnukwu nsogbu di n'ala Naịjirịa.

N'okwu ọnụ ya "kee ka ndị mmadụ nkịtị ga-enwe ike ji sọọsọ okwute buso ndị jiri egbe ọgwụ?".

Gotep ju kwa ajụjụ na gini mmere ndị agha enweghị ike ịkwụsị ndị a jiri egbe egbu mmadụ.

Gotep juru "gịnị mere ego awapụtara maka ịbuso ndị a jịrị egbe agha?"

Jenkins Eni bubu onye biri n'Asaba na Delta steeti bubu ebe ọzọ ndị ọchịehi jiri egbe na-ebuso ndị mmadụ ọgwụ kwuru na Naịjirịa enweghị ndị ọchịchị.

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Onweela ndị kwuru na ndị a na-egbu mmadụ abụghị ndị ezigbo ọchịehi

Mana o kwetekwara na ihe Ortom kwuru.

Eni kwuru n'uche ya, ụzọ ka mma ịgbanahụ nwakpo a bụ ị dị njikere ịchekwa onweha.

N'onụ okwu ya "ihe dị njọ n'ihe a bụ onwere ike ikesa ala

Uwe ojii steeti

Nrụrịtaụka a ebiliteela okwu gbasara uweojii steeti na nkpa o nwere na nchekwa obodo.

Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Uweojii steeti ọ ga-ebute udo Naịjiria na-achọ

Onweela ndị kwuru na sọọsọ uwe ojii steeti ga-akwụsị kpam kpam nkpankpa niile na-eme na steeti dị icheiche na Naịjirịa.

Gotep na Eni gwara BBC Igbo echiche ha gbasara nrụrịtaụka a.

Gotep kwuru na uweojii steeti ga-ebute mgbagwoju-anya maka ọrụ ha na nke ndị steeti ga-eyiri ibe ha. Ihe a ga-ebute esemookwu 'jurisdiction' dịka ndị bekee sịrị akpọ ya.

Mana Eni kwuru na ya enweghị ntụkwasị obi na ihe akporọ uweojii steeti maka n'uche ya, ihe a ga-enye ndị uweojii ohere ịhọgbụ ndị mmadụ.