Ha anwụghị, ahụ ka ha merụrụ- Ndị uweojii Imo

Ụkwụ pụrụ ndị mmadụ ọsọ n'ebe a na-agba nkwụ nwaanyị n'Isiala Mbano dị n'Imo steeti ka egbe ndị uweojii na-agba iji mee amansị tụrụ mmadụ abụọ.
Akụkọ kwuru na ndị uweojii abụọ so ndị nwere agba gaa agbamnkwụ otu nwata nwaanyị e nyere aha ya dịka, Chilụaka Agụaka, n'ụbọchị ụka, gbagburu mmadụ abụọ.
Mana ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii Imo steeti bụ Andrew Enwerem, gwara BBC Igbo na n'ezie na ọ bụ naanị ahụ ka ndị uweojii merụrụ mmadụ abụọ ahụ, na ha anwụghị anwụ.
Enwerem kwukwara na ọ bụ ndị uweojii si steeti ọzọ ndị na-enweghị ikike site n'aka Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ Chike Ezike, mere ihe ahụ.
Enwerem sị: "E nwere ndị uweojii du nnukwu mmadụ abụọ gaa ebe a na-agba nkwụ merụrụ mmadụ abụọ ahụ. Mmadụ abụọ ndị ahụ nọ n'ụlọọgwụ ugbua na-anara ọgwụ. Onweghị onye nwụrụ n'ihi ya.
Kọmishọna ndị uweojii n'Imo steeti enyela iwu ka e nyopụta ebe ndị uweojii ahụ siri bịa na ihe mere ha jiri gbaa ya bụ egbe."
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na otu n'ime ndị uweojii na-eme ụghara n'ebe a na-agba nkwụ nwaanyị, ji otu aka na-agbali egbe AK-47, ma egbe ahụ pụnahụrụ ya gbanye n'etiti ndị mmadụ.
Mgbọ merụrụ mmadụ abụọ e nyere aha ha dịka Ikechukwu Onwudiwe na Uzochukwu Ogbuhuruzo, ezigbote ahụ; otu n'aka, otu n'ụkwụ.
Akụkọ kwuru sị na dịka e buuru ndị merụrụ ahụ gawa ụlọọgwụ Imo State University Teaching Hospital, Orlu, ndị ntorobia ji iwe chọrọ ịkụgbu ndị uweojii ahụ mana ndị na-eme mmemme zọrọ ha.
Mgbe onye ntakụkọ jụrụ Enwerem ma anwụchịrị ndị uweojii mere nke a, ọ kọwara na oge ndị uweojii rutere ebe ahụ, na ndị uweojii kpara mkpamkpa ahụ agbafuola.
Akụkọ ga-amasị gị:
- Ndị ọrụ ahụike agbaala abụbụọrụ
- Otu Naịjirịa gara Commonwealth ga-alọta echi
- NCC: Telelogy ga-egosirịrị na ha ma ọrụ