Ụlọomeiwu chọrọ ịmalite ịchụ Buhari n'ọrụ n'ike

Ụlọomeiwu nta Image copyright Facebook/Nigerian HoR
Nkenke aha onyonyo Nke a bụ mbu ndị ụlọomeiwu nta kwutere okwu ịchupu Onyeisiala Buhari

Ndị ụlọomeiwu nke nta malịtere ụka maka ego dị $496,374,470.00 nke onyeisiala Muhammadu Buhari jiri zụta ụgbọelu agha Tucano maka ịlụ ọgụ nchekwa obodo nke na-ada na mpaghara Naịjiria ụfọdụ.

Ihe bulitere okwu a bụ akwụkwọ ozi nke Buhari deere ndị ụlọomeiwu ahụ ebe ọ nọrọ gwa ha na ya ejirila ọkpụrụkpụ ego ahụ gonara ndị mba Amerika ụgbọelu ahụ.

Onyeisiala anataghị ikike ndị ụlọomeiwu dịka o kwesịrị.

Ya mere Kingsely Chinda nke na-anochite anya ndị Rivas steetị jiri baa mba maka agwa ahụ onyeisiala kpara na ibu ụzọ bulichaa ite n'isi ma bịa gwọwa ajụ.

N'okwu Chinda, "ihe bụ ihe mkparị nye ndị ụlọomeiwụ. Ọ dịzị ka anyị a bụ nkịta na-agbọ ụja na-efụ. Agwa a ezuola ịchụda onyeisiala a n'ọrụ".

Okwu a kpalitere mmụọ ndị omeiwu a nke mere na ọtụtụ n'ime ha kwadoro ya bụ alo.

Mgbe onyeisioche ụlọomeiwu nta bụ Yakubu Dogara hụrụ na ebe niile ekporola ọkụ, ọ rịọrịọ ndị otu ya ka ha wedeta obi ala maka na ọ bụ ya ka onyeisiala detara ya bụ akwụkwọ.

O kwere nkwa na ya ga-ekwu mgbe a ga-etinye ọnụ na ya bụ okwu.

Mana arịrịọ a emeghị ka obi dajụọ ndị omeiwu, kama ha gara n'ihu ịcheta ọtụtụ mmadụ a napuru ndụ ha n'ike n'ọchịchị a.

Aliyu Madaki nke Kano kwadoro ka achụpụ onyeisiala Buhari ngwangwa maka amaghị eme ya.

Ọ kpọkuru ndị otu ya ka ha kwado ihe Chinda kwuru.

Image copyright @bashirahmad
Nkenke aha onyonyo Ọchịchị Muhammadu Buhari jiri nde $462 zụta ụgbọelu agha Tucano

Sunday Karimi kwetara na onyeisiala Buharị dara iwu obodo, na e kwesịrị ịta ya ahụhụ dịka iwu kwuru.

Onyema Chukwuma bụ osote onyeisi pati kacha nta n´Ụlọomeiwu ahụ tụtara alo ka azaghachie Buhari ya bụ akwụkwọ odere chetara ya maka iwu ọ dara ma gwa ya ka o jikere ịta ahụhụ ya na ya so.

Na agbanyeghị nke a, Oker Jev chetara ndị otu ya na e kwesiri itinye anya na ya bụ okwu tupu echewa echiche maka ịchupu onyeisiala.

TJ Yusuf nke Kogi steeti dọrọ aka na ntị ka ndị otu ha kwuo eziokwu gbasara ya bụ okwu.

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a