Akụkọ kachasị n'abalị a: Buhari rituo n'ọkwa ọchịchị - Ndị ụkọchukwu Katolik
Akụkọ kachasị n'abalị a
Ndị ụkọchukwu akatọọla Mohammadu Buhari
Ebe foto si, Getty Images
Ndị ụkọchukwu katolik ekwuola na oge eruola Muhammadu Buhari ritu n'ọkwa ọchichị dika onye isi ala Naijiria maka ndị ọchịehi bu egbe gburu ụkọchụkwu abụọ na mmadụ iri na isi na Benue.
Mana Buhari na-arịọ ndịdị, o kwukwara na ogbugbu mmadu na-eme ugbua na Naijiria ga akwụsị kpam kpam.
Ikpe sinetọ Peter Nwaoboshi ka dị kwa
Ebe foto si, Sinetọ Peter Nwaoboshi
Ụlọikpe dị na Lagos enyeela Sinetọ Peter Nwaoboshi ụbọchị abụọ ị wepụta mmadụ abụọ ga-akwụrụ dịka onye akaebe ya ma kwụọ ụgwụọ ruru nde iri ise tupu ha tọhapụ ya na mkpọrọ.
Cheta na Nwaoboshi na-aza ajụjụ gbasara mpu na aghụghọ n'aka ndị EFCC maka ego ruru nde naira narị atọ, iri abụọ na abụọ.
Nọt na Saut Korea enweela nkwekọrịta
Ebe foto si, Getty Images
Ndị na-achị Nọt na Saut Korea enweela nkwekọrịta na ha ga-ewepu ogbunigwe nuklear niile dị n'ala ha kpam kpam.
Ha kwuru ihe a n'ọgbakọ Kim Jong-un na Moon Jae-in nwere na Saut Korea taa.
Iniesta ga-apuola na Barcelona
Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, obi agbawaala ndị ụfọdụ ndị na-akwadọ otu Barcelona.
Andres Iniesta ekwuola na ya ga-apụụ na Barcelona na ngwụcha afọ a.
Andres dị afọ iri ato na atọ eruola afọ iri abuọ na Barcelona.
Gere akụkọ mere n'abalị a n'otu nkeji:
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Ihe nkiri anyị taa
Atiku: A ga m ekewa ikike ọchịchị gọọmentị etiti ma m bụrụ onyeisiala