Popu Francis etinyela ọnụ na mkpamkpa mere ndị ụka Benue

Popu Francis Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Popu Francis

Onyeisi ndị ụka Katolik bụ Popu Francis ekwuola na obi adịghị ya mma maka ndị ụkọchụkwụ abụọ na mmadụ 16 ndị ọzọ ndị ochịehi gburu na Benue steeti ụbọchị 25 ọnwa Epurel.

N'ime ozi ya ụbọchị ụka n'ama Petersquare, Pop Francis kpere ekpere ka udo laghachị n'otu ndị ụka Kraist.

Popu dere na twitter na ogbugbu mmadụ a bu ọrụ ekwensu.

Cheta na ndị ọchịehi gburu Ụkọchukwu Joseph Gor na Felix Tyolaha, na mmadụ 16 ndị ọzọ ka n'ụlọụka St Ignatiuas n'obodo Mbalom na Benue steeti.

Onyeisiala Naịjiria bụ Mohammadu Buhari agaala mba Amerika ugbua, akụkọ na-ekwu na nchekwa obodo ga-eso na mkparịtaụka ya na Donald Trump.

Akụkọ ndị ga-amasị gị