Nwodo: Ndigbo agaghị alụ agha nnwereonwe ọzọ

Nnia Nwodo
Nkenke aha onyonyo Nnia Nwodo malitere dịka onye ndu nke itoolu (9) ndị Ohaneze Ndigbo n'afọ 2017

Onyeisi ọhanaeze bụ Nnia Nwodo ekwuola na Igbo agaghị alụkwa ọgụ nnwereonwe ọzọ kama ha na ndị agbụrụ nwere nkwekọrịta yiri ga-achịkọta site n'ụzọ mkparịtụka nweta nhaziharị Naịjiria na mpaghara na ọnọdụ dịka ebunobi ndị nna anyị ha bidoro ala anyị si chee ya.

Nwodo kwuru nke a n'Enugwu n' ọgbakọ, 'Nkata Ụmụ Ibe' nke mbụ nke Centre for Memories hiwere.

O kwuru na ndị mpaghara ndịda n'etiti Ugwu-Awụsa ga-atụnyere naanị onye na azọ ọkwa onyeisiala onye pati ya kwere nkwa na ha ga-ahazigharịa Naijiria na mpaghara.

"N'echiche anyị, ọgụ ọbụla a ga-asị na ọ bụ sọ Ndigbo ga-alụ ya aghaghị adị ire ka nke anyị na ndị ọzọ kwekọrịtara na ihe ndị nnanna anyị ha nwere ka na 1963 nke agha gbosara nke mere ka ala anyị bụụ otu ngalaba ma meekwa gọọmenti etiti ka ọ bụrụ Onyejiikeniile."

O kwukwara sị, "Anyị na-agba mbọ na-ekwu na onye ọ bụla chọrọ ịchị Naịjirịa n'afọ 2019, na nhazigharị Naijiria na mpagahara na mpaghara (restructuring) ga-eso na nkwupụta nke pati ya. Anyị agaghị atụnyere onye ọbụla achọghị nhazịharị na mpaghara."

Onye ọbịa pụrụiche na ọgbakọ ahụ bụ guest speaker, Prof. Chidi Odinkalu, onye kwuru maka "Igbo Ekunie: I he mmụta dị na ọgwọgwọ mere ka alụchara agha" tụrụ arịrị na gọọmentị etiti etinyeghị ego na imezu atụmatụ mkpezi, nhazig na ịnabatagharị Ndịigbo ka alụchara Agha.

Odinkalu kwupụtara mkpa ọ dị inyere ndị ntorobịa Igbo aka inwe nka and ịgba mbọ ma chọ ụzọ ha na ndị ọzọ nọ n'ala Naijiria ga-esi na-ebikọ maka akụnaụba.

Akụkọ ga-amasị gị

Ihe ndị ọzọ n'akụkọ a