Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Ipob na Idika Kalu na-atụ onwe ha

Akụkọ ndị kachasị mkpa mere nụtụtụ a n'ichafu:

IPOB agọọla ebubo Kalu Idika Kalu

Image copyright Getty Images

IPOB agọọla ebubo onye bụbu mịnịsta na-ahụ maka okwu gbasara ego bụ Kalu Idika Kalu boro ha na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe n'ụlọ ya.

Onye odeeakwụkwọ mgbasaozi IPOB bụ Emma Powerful kwuru na ebubo ahụ na-atọ ọchị n'ihi na IPOB na Kalu enweghị mmekọrịta ọbụla nchancha.

Powerful kwuru na IPOB ga-ekpe Kalu n'ulọikpe maka ebubo a.

Ndị turu ugo na Headies

Image copyright Getty Images

David Adedeji Adeleke, onye otiegwu a maara amara dịka,'Davido',bụ onye turu ugo ọkachasị n'iti egwu na nnturuugo Headies mere n'abalị Satode.

Egwu Davido a kpọrọ 'Fia' bụ nke bụ egwu kachasị.

Ndị ọzọ nwetara nturugo bụ Wizkid, Simi, Omawunmi, Tiwa savage na ndị ọzọ.

Mana ọ tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya na egwu Olamide na Phyno abaghị na ndị turu ugo n'emume ahụ.

Naịjirịa azụọla ugbọele abụọ na-atụ ogbunigwe

Image copyright Getty Images

Onyeisiala Naịjirịa Muhammadu Buhari ekwuola na gọọmentị azụụla ụgbọelu abụọ na-atụ ogbunigwe maka ibuso ndị oyiegwu agha.

Buhari kwuru na a zụrụ ụgbọelu a na-aka mba Russia n'ime ọnwa Epureelụ maka ụbọchị ncheta afọ iri ise na anọ ndị agha ụgbọelu Naịjirịa.

Ogbunigwe adaala na Gaza

Image copyright Getty Images

Ụlọọgwụ dị na Gaza ekwuola na mmadụ isi n'ala Palestine anwụọla oge ogbunigwe dara na obodo Deir al-Balah n'ala ahụ.

Onweghị onye mara onye tụrụ ogbunigwe nke a.

Otu Hamas na-ebo mba Israel ebubo , mana Israel kwuru na aka ha adịghị na mkpamkpa ahụ.

Alex Ferguson wara ahụ

Image copyright Getty Images

Onye bụbu onye nkuzi otu Manchester United bụ Alex Ferguson emeela iwaahụ nke ụbụrụ maka ọbara na-agba ya n'ime isi.

Manchester United kwuru na ọ na-agbake ugbua.

Gee nkeji anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionBBC Nkeji