Headies 2018: Davido bụ onye kachasị turu ugo

Davido Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Davido aturuola ọtụtụ ugo na Naịjiria na ọtụtụ ala ndị ọzọ

David Adedeji Adeleke, onye otiegwu a maara amara dịka,'Davido',bụ onye turu ugo ọkachasị n'iti egwu(artiste of the Year) na nnturuugo Headies mere n'abalị Satode.

Egwu Davido a kpọrọ 'Fia' tukwara ugo dịka bụ egwu kachasị mma (Song of the Year), nakwa egwu kacha ewu(best pop song)

'Oge eruola ị nyere ndị oti egwu ka na-apụta apụta aka'

N'okwu ya oge ọ na-anara nturugo ahụ, Davido kwuru na oge eruola ndị ụkwa ha kwusiri ike n'iti egwu inye ndị na-apụta apụta nkwalite na nka ha.

Ọ sị,"oge eruola inyere ndị otiegwu ka na-apụta apụta aka".

Ndị ọzọ nwetara nntulugo bụ Simi,Wizkid,Omawunmi, Tiwa savage na ndị ọzọ.

Simi na ndị otiegwu ụmụnwaanyị

Image copyright @SympLySimi
Nkenke aha onyonyo Simi bu onye ama ama maka olu ọma ya puruiche

Simi pụtara dịka onye ọkachasị eti egwu n'ime ụmụnwanyị n'afọ 2018.

Simi turu ugo onye nchịkọta egwu kachasị mma, onye egwu kachasị ụtọ abụ gbasara ihunaanya na onye ritere 'Best Recording' n'afọ 2018.

Simi nupuru Tiwa Sava n'okwa nke a.

Ma ọ tụrụ ọtụtụ ndị mmadụ n'anya na egwu Olamide na Phyno abaghị na ndị turu ugo na mmemme ahụ.

Ụfọdụ nturu ugo Davido turu n'oge garaaga

Image copyright Getty Images
Nkenke aha onyonyo Davido na Wizkid bụ ndị aha ha na-ewu ewu ugbua n'agbara ọfụ

Davido enwela nzere ruru iri atọ.

Ụfọdụ n'ime ha bụ onye okacha eti egwu BET, MTV Africa, Kora, Channel O na Headies.

Ọ bụ egwu Davido tiri n'afọ 2011 ọ kpọrọ 'Dami Duro' bụ ihe mere ka ọtụtụ mmadụ na Naịjirịa na mpaghara Afrịka marị ya ọfụma ọfụma.

Ugbua Davido bụ onye ama ama na mba ụwa niile.

Ụfọdụ n'ime egwu Davido bụ Fall (2010), If (2017), Aye (2015), The Sound (2015) na Biko (2016) na ọtụtụ ndị ọzọ.

Akụkọ ga-amasị gị

Isiokwu Ndị Emetụtara