Akụkọ kachasị n'abalị : NDLEA anwụchiela ndị na-ere Codeine n'Edo steeti
Akụkọ kachasị n'abalị a
NDLEA anwụchiela ndị na-ere Codeine n'Edo steeti

Ngalaba na-ahụ maka ọgwụ ike bụ NDLEA ekwuola na ha nwụchiri ụmụnwoke ruru iri atọ na atọ na ụmụnwanyị asatọ na-ere ọgwụ codeine n'Edo n'ime ọnwa Epụreel.
Ha kwuru na ha ga-agba mbọ hụ na a kwụsịrị ndị niile na-ere ọgwụ codeine n'Edo steetị kpam kpam.
Mmadụ karịrị puku apụtala n'aka ndị Boko Haram

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa ekwuola na ha azọpụtala mmadụ karịrị otu puku n'aka ndị agha Boko Haram.
Ha kwuru na ha zọpụtara ndị gụnyere ọtụtụ ụmụnwaanyị na ụmụaka n'obodo dị iche iche n'ime Boma dị na Borno steeti.
Ndị omeiwu adọọla IGP aka na ntị

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki na onyeisi ndị omeiwu nta bụ Yakubu Dogara agwala onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari ka ọ dọọ onyeisi ndị uweojii bụ Idris Ibrahim aka na ntị.
Ha abụọ kwuru na Idris nupuru isi n'iwu site n'ụdịrị ọnọdụ eji nwụchie Dino Melaye bụ onye omeiwu.
Vladimir Putinaṅụọla iyi ọrụ maka ọchịchị ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Vladimir Putin aṅụọla iyi ọrụ maka ọchịchị ya dịka onyeisiala mba Rọshịa nke ugboro anọ ebe o kwere nkwa iwekọta onyinye mba ha niile iji mepụta oke ihe.
Mmadụ ruru puku ise gara emume ahụ e mere nke ukwuu n'ime ụlọ Kremlin.
Ekpere maka Alex Ferguson

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, Ryan Giggs na ọtụtụ ndị ọgbabọọlụ na-ekpe ekpere ka Sir Alex Ferguson bụ onye chịkọtaburu Manchester United gbakee n'ọrịa ya.
Cheta na a wara Alex Ferguson ahụ maka ọbara na-agba ya n'ime ụbụrụ isi ya.
Gee akụkọ anyị
Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile
Lee ihe nkiri taa
Gọvanọ Umahi sị sị kpụta Charles Ogbu, gini ka omere?