Ntuliaka APC Imo: Ndị uweojii anwụchiela mmadụ anọ

Uweojii Naijiria Image copyright AFP
Nkenke aha onyonyo Ndị uweojii na-ekwu na anaghị emeta ha nke ọma etu ekwesịrị

Ndị uweojii anwụchiela mmadụ anọ a na-enyo enyo maka izu akwụkwọ na akụrụngwa ntuliaka imeụlọ APC n'Imo Steeti.

Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii nke ala anyị bụ Jimoh Moshood, kwuru na ndị uweojii nwụchiri ha n'otu ụlọ oriri dị n'Abuja, site n'ama mmadụ gbaara ha.

Moshood nyere aha ndị a anwụchiri dịka; Engr. Ikpamezie Innocent, 39, onye okpuru ọchịchị Mbaitoli n' Imo steeti; Lawrence Archibong, 34, onye okpuru ọchịchị Akpabuyo nke Cross Rivers; Kelechi Afonne, 27, onye okpuru ọchịchị Isiala Ngwa North nke Abia steeti nakwa Joseph Martins, 28, onye okpuru ọchịchị Ivo nke Ebonyi steeti.

Cheta na ọgbaghara sochiri ntuliaka imeụlọ APC mere n'Imo steeti nke butere esemokwu n'etiti Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha na ndị ọzọ welitere isi n'otu APC steeti ahụ nke Osote Govanọ bụ Eze Mmadụmere.

N'ụbọchị Satọde gara aga, ọkụ gbara n'ụlọọrụ APC na steeti ahụ ma mebie ọtụtụ ihe dịka ngwaọrụ nakwa akwụkwọ ntuliaka dị mkpa.

Akụkọ ga-amasị gị: