Akụkọ kachasị n'abalị : NAFDAC na-achọ onye ụlọọrụ Emzor

Akụkọ kachasị n'abalị a

NAFDAC na-achọ onye ụlọọrụ Emzor

Ngalaba na-ahazi nlekọta nri na mmepụta ọgwụ a kpọrọ NAFDAC n'aha ịchafụ kwuru na ha agwaala ndị ụlọọrụ Emzor ka ha kpụputa onye ọrụ a putara n'ihe onyonyo nke BBC mere maka ịgosi etu esi eji azụ aka ere mmịrị ọgwụ ụkwara nwere Codeine.

NAFDAC kwukwara na ọ bụrụ na Emzor akpụputaghị nwoke a na ha ga-ekwu na ọ bụzị onye a na-achọ achọ.

JTF na-agọ ebubo na ha mebiri ala Naija Delta

Image copyright Getty Images

Ndị agha JTF na-agọ ebubo na ụzọ esi emebi ụlọọrụ mmanụ mabidoro n'iwu na mpaghara Niger Delta anaghị echekwa gburugburu.

JTF kwuru na ọ bụ eziokwu na mmanụ mebiri ala na osimmiri na Naija Delta mana ọ bụghị ọrụ aka ha.

A tọhapala ụmụnwoke abụọ ndị Briten

Image copyright AFP

A tọhapula ụmụnwoke abụọ sị na mba Briten a tọrọ na-ebe njem n'ala Congo n'ụbọchị ole na ole garaaga.

Briten kwuru na ha ebidola ịkpọghachị ndị ala ha niile mere njem na mba ahụ.

Anyị anaghị atụ egwu - Super Eagles

Image copyright Getty Images

Ọnụ na-ekwuchir otu Super Eagles ekwuola na odighị mkpa ịkụ obi maka mmerụ ahụ ndị otu ha.

O kwuru na ọ bụ ezie na Leon Balogun, Ogenyi Onazi, Wilfred Ndidi naTyron Ebue merụrụ ahụ ugbua mana ha na-agbake.

Ihe mere na Premier League taa

Image copyright Getty Images

Liverpool meriri Brighton ọkpụ anọ na-asataghi ihe

Stoke City meriri Swansea ọkpụ abụọ a satara otu.

Arsenal meriri Hudersfield otu ọkpụ.

Mohammed Salah bụzị onye na-ewu ugbua, e nyeela ya akpụkwụ olaedo n'asọmpị iko Premier League nke afọ a.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile