Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue ọzọ

Ndị ọchịehi egbuola ọtụtụ mmadụ na Benue ọzọ

Ọchịehi

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ji egbe a na-eche na ha bụ ndị ọchịehi gburu mmadụ iri ma meruo mmadụ iri na ise ahụ n'obodo Turan n'ime Benue steeti.

Otu n'ime ndị pụtara na ndụ na mkpamkpa a kwuru na ndị a wakpọrọ ha n'etiti isi ụtụtụ oge ha niile na-arahụ ụra.

Saraki azahachila ndị uweojii

Ebe foto si, Bukola Saraki/Twitter

Onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki gọrọ akụkọ na-ebo ya ebubo na aka ya dị ohi mere na Offa n'ime ọnwa Epureel.

Saraki na ebo onyeisi ndị uweojii bụ Ibrahim Idris ebubo ị ji ohi nke a mebi aha ya.

Aja ọkụ egbuola ọtụtụ mmadụ na Guatemala

Ebe foto si, AFP/Getty

Ajọ ọkụ na-abọpụta n'ime ala gburu mmadụ iri abụọ na ise (25) nakwa meruo ihe ruru narị mmadụ ahụ na Guatemala.

Ndị ụlọọrụ gbatagba obodo ahụ ekwuola na-ugbua onweghị ụgbọelu na-efebata n'obodo ahụ maka nnukwu ntụ dị na mbarigwe.

Super Eagles eruola ala Austria maka nkwadebe iko mba ụwa

Ebe foto si, @NGSUPEREAGLES

Ndị otu Super Eagles eruola mba Austria ebe a ga-ebido nkwado maka asọmpị iko mba ụwa ga-ebido n'ụbọchị iri na isi na mba Russia.

Cheta na ọgba bọọlụ Mikel Obi kwusiri ike na otu Super Eagles kwesiri igbasị mbọ ike karịa etu esi agba ugbua ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịme ọfụma na Russia.

Gee nkeji anyị

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị: