Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Yaya Toure eboola Guardiola ebubo mmegbu

Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a

Guardiola na-emegbu ndị ojii- Toure

Yaya Toure bụbụ onye ọgbabọọlụ otu Manchester United ekwuola na onye na-achịkọta yabụ otu bụ Pep Guardiola na ndị bụ ndị ojii n'otu ya na-enwe karị nsogbu oge ọbụla.

Yaya Toure bọrọ Guardiola ebubo na ọ bụ oge ọbụla ka o na-emegbu ya mgbe ọ nọ na Manchester City.

ICPC ekpeela Mounir Gwarzo

Ngalaba na-ahụ maka nyocha npu na aghụghọ akpọrọ ICPC n'aha ichafu ekpeela Mounir Gwarzo bụbụ onye isi ndị ụlọọrụ Securities and Exchange Commission na bekee.

ICPC na-ebo Gwarzo ebubo mmerụ aka ruru anọ n'ụlọ ikpe nke dị na Abuja.

Saraki ga-ede aziza ya n'akwụkwọ

Ndị uweojii alaghachila azụ n'oku ha kpọrọ onyeisi ndị omeiwu ukwu bụ Bukola Saraki.

Ha sị na ha chọrọ ka Saraki de aziza ya n'akwụkwọ gbasara ohi mere n'obodo Ofa na Kwara steeti.

Saraki n'onwe ya kwuru na obi ya dị ọcha, na ya ga-eme kwa ihe niile ndị uweojii chọrọ.

Nkwadebe ọgbakọ Trump na Kim ka na-aga

Gọọmentị mba Amerika ekwuola na nkwadebe ọgbakọ onyeisiala ha bụ Donald Trump na onyeisiala mba Nort Korea bụ Kim Jong-un n'ụbọchị iri na abụọ n'ime ọnwa Juun na-aga ọfụma.

Mana US kwuru na anaghị ewepụ mmachị amachịrị Nort Korea ruo mgbe atọgbọrọ mgbọ nuklee ha nille.

Gee nkeji anyị ugbua

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ịkọ mgbe ọbụla

Akụkọ ga-amasị gị: