Akụkọ kachasị n'abalị a: Ịngland abaala otu nke iri na isi n'asọmpị iko mbauwa
Ịngland agaala agba nke iri na isi
Ebe foto si, Getty Images
England abaala otu nke iri na isi n'ime asọmpị iko mba ụwa n'eme n'Russia ugbua.
England meri Panama ọkpụ isi mana asataha otu.
O nweghị onye meri n'etiti Senegal na Jaapan makana ha gbara ọkpụ abụọ abụọ
Cheta na Poland na Kolombia ga-asọ mpi nke ha na elekere isi nke abali taa.
Ogbunigwe agbariela ụlọ na Jamani
Ebe foto si, Getty Images
Ndị uweojii na Jamani ekwuola na mmadụ ruru iri abụọ n'ise meruru ahụ oge ogbunigwe bibiri otu nnukwu ụlọ n'obodo Wuppertal.
Ndị uweojii na ndị na-azọ ndị mmadụ kwuru na ha ka na-enyocha ihe butere mkpamkpa a.
Gọọmentị Plateau etiila iwu ọnọdụ gbata gbata
Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ anyị na-anụ ugbua na-ekwu na ọtụtụ mmadụ anwụọla na Plateau steeti oge ndi jiri mma na egbe nwakporo obodo dị iche iche na Barkin Ladi n'ime Plateau.
Akụkọ a kwukwara na ndị a sunye ọkụ n'ụlọụka na kwa ọtụtụ ụlọ n'ime obodo ahụ.
Gee akụkọ anyị nke abalị a
BBC Nkeji
Lee ihe nkiri anyị
Obodo Abonnema dị na Rivas steeti na-echeta etu ha si jụ Biafra afọ 50 gara aga