Akụkọ kachasị n'ụtụtụ a: Onye nkuzi ndi Jamani sị na ọ dị mma ka esị gbapụ ha

Ha kwesiri ịgbapụ Jamanị n'iko mbaụwa - Onyenchịkọta ha

Image copyright Getty Images

N'egwuregwu, onye na-achịkọta otu Jamani n'asọmpị iko mbaụwa bụ Joachim Low ekwuola n'ezie na ekwesiri ịgbapụ agbapụrụ ha n'asọmpị a makana ndị otu ya agbaghị nke ọma cha cha na ya bụ asọmpị.

N'akụkọ nyiri ibe ya, ndị ga asụ mpi nke ha taa bụ

Senegal na Kolombia, Jaapan na Poland, Panama na Tunisia, na kwa Ịngland na Belgium.

Iwe di n'obi ndịBiafra Zionists Federation

Image copyright Getty Images

Otu kpọrọ onwe ha Biafra Zionists Federation emela ngagharị iwe n'ihu ụlọikpe dị n'Enugwu makana ndị uweojii akpọpụtaghị onyeisi ha bụ Benjamin Onwuka na ndị otu ya bịa ụlọikpe n'ụbọchị ikpe ha.

Cheta na ndị uweojii nwụchịrị Benjamin Onwuka na ndị otu ya makana ha wakporo obi gọọmenti nke Enugwu steeti n'ụbọchị ncheta Biafra.

"Arukwahị m!" - Ndị nkuzi Cross River

Image copyright Getty Images

N'okwu gbasara agụmakwụkọ ka ndị nkuzi ụlọakwụkwọ primarị na sekọndarị ga-ebido arukwahị m taa na Cross River Steeti.

N'ime akwụkwọ onyeisi ha bụ Eyo-Nsa Itam dere, ha kwuru na iwe ha bụ na gọọmentị azabeghị ihe ọbụla ha na-arịọ ha kemgbe maka ihe ọdịnma gbasara ndị nkuzi.

Uru ọ ga-apụta n'ọgbakọ Trump na Putin?

Image copyright Getty Images

Na mba ofesi, gọọmentị ala Rọshịa ekwuola na onyeisiala Amerika bụ Donald Trump na onyeisiala ha bụ Vladimir Putin ga-enwe ọgbakọ n'ala ọzọ akpobeghị aha.

Rọshịa na-enwe olileanya na ọgbakọ a ga-edozi mmekọ dị na-etiti ala ha na Amerịka.

Gee akụkọ anyi n'otu nkeji

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionAkụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Ngwaọrụ gị akwadoghi ọkpụkpọ mgbasa ozi
Media captionNwa bebi a ka m ji achụ obi mgbawa so ụmụnwaanyị

Isiokwu Ndị Emetụtara