Ohaneze: Were ego Abacha rụọ ụlọọgwụ, okporoụzọ

Dr Ezechi Chukwu Image copyright Uche Akolisa
Nkenke aha onyonyo Dọkịta Ezechi Chukwu bụ onyeisi Ohaneze n'Imo steeti ma bụrụkwa otu n'ime ndị isiọrụ Ohaneze nke etiti

Onyeisi Ohaneze n'Imo steeti bụ dọkịta Ezechi Chukwu, akatọọla atụmatụ ikesa ego Abacha zufuru na steeti 19 dị na Naijria.

Gọọmenti etiti kwuru na ha ga-eke ndị nọ n'ụbịam nde dọla 322 ($322 million) bụ ego Abacha zupuru e si Swizaland weghachị, na steeti dị 19 bido n'ọnwa Jụlai site n'inye ezinaụlọ ọbụla puku naịra ise kwa ọnwa.

Mana na mkparịtaụka BBC na Chukwu nwere n'ekwenti, o kwuru na enweghị uru nke a bara.

"Gọọmentị kwesịrị ịwepụta atụmatụ ụzọ a ga-eji ya bụ ego were rụọ ọrụ maka ọdịmma ndị Naijiria site n'ịrụ ihe na-enyere ndụ aka dịka ụlọọgwụ, imezi okporoụzọ maọbụ inye mmiri n'ime obodo.

I were ego na-eke ndị mmadụ n'ụdị dị iche iche agaghị enye anyị ihe achọrọ."

Dịka gọọmentị siri kọwaa, ezinaụlọ 302,000 ga-erite erere site n'ịnata puku naira ise kwa ọnwa.

Steeti ga-erite n'atụmatụ nkesa ego ahụ bụ Naịja, Kogi, Ekiti, Ọshụn, Ọyọ, Kwara, Krọs Riva, Bawuchi na Gombe steeti.

Ndị ọzọ bụ Jigawa, Benue, Taraba, Adamawa, Kano, Katsina, Kaduna, Platu, Nasarawa, Anambara nakwa ndị gbara ọsọ ndụ na Borno steeti.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: