Bianca Ojukwu: Lee ndị na-ama ya aka mgba

Bianca Ojukwu Image copyright Bianca Ojukwu/ facebook
Nkenke aha onyonyo Ojukwu lụrụ Bianca n'afọ 1994

Bianca Ojukwu bụ nwunye Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu ebidola na-akwado ịzọ ọkwa ọchịchị dịka sinetọ n'ime Anambara steeti.

Bianca kwuputere ebumnuche ya ịzọ ọkwa a n'ọgbọ egwuregwu dị n'Ekwulọbịa n'Agụata n'ime Anambara steeti.

Ọ ga-azọ ọkwa a n'ime otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Grand Alliance (APGA).

Mana mmeri anaghị abata n'aka Bianca na mfe maka ndị ọzọ na-azọ ọkwa bụ Ifeanyi Uba na Nicholas Ukachukwu.

Chetakwa na APGA emebeghị ntuliaka nke patị maka ịhọpụta ndị ga-azọ ọkwa dị iche iche n'okpuru pati ha na ntuliaka 2019.

Bianca ọ ga-enwe mmeri?

Ifeanyi Ubah bụ otu n'ime ndị na-azọ ọkwa banyere otu APGA n'ọnwa Nọvemba, afọ 2017.

Image copyright Bianca Ojukwu/ facebook
Nkenke aha onyonyo Bianca Ojukwu bụ onye meriri n'asọmpị 'nwaanyị kachasị maa mma' na Naịjirịa nke afọ 1988

Akụkọ kọwara na ya na gọvanọ Willie Obiano bụ ezigbo enyi; cheta na ọ kwadoro Obiano oge ọ chọrọ ịzọ ọkwa dịka gọvanọ Anambara steeti.

Akụkọ kwukwara na Willie na-akwado Uba ugbua n'ebumnuche ya ịzọ ọkwa sineti.

Kedụ maka Nicholas Ukachukwu?

Oteela Ukachukwu nọ n'ọkwa ọchịchị dị iche iche n'ụlọomeiwu nta Naijrịa.

Ukachukwu bụkwa onye ama ama nke ọma n'ọgbakọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị iche iche na steeti ahụ.

Mana naanị ihe Bianca nwere bụ na ọ bụ onye rụburu ọrụ dịka onye nnọchịte anya Naịjirịa na mba Spein.

Ugbua bụ oge mbụ o tinyere aka nke ọma n'ịzọ ọkwa ọchịchị ọbụla na Naịjirịa.

Mana di ya bụ Ojukwu.

Ihe a bụ ihe na-enye ndị na-akwado ya obi ike n'agbanyeghị na ndị dike dịka Ifeanyi Uba na Nicholas Ukachukwu zọnyere ụkwụ n'ọsọ a.

Mana Ojukwu bụ onye hibere otu a kpọrọ APGA.

Ndị na-akwado Bianca nwere olileanya na APGA ga-enye Bianca ikike a maka ihe ọma niile di ya bụ Ojukwu mere pati ha.

Akụkọ ga-amasị gị