Ohaneze ndịgbo enyeela Buhari iwu kpụ ọkụ n'ọnụ

Naịjirịa bụ ala kachasị na ndị ogbenye - May

Theresa May

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisiala mba Britain bụ Theresa May ekwuola na Naịjirịa nwere ndị kachasị daa ogbenye n'ụwa gburugburu.

May kwuru nke a n'ala Saut Afrika ebe ọ gara njem. O kwukwara na ọ ga-adịrị ụwa mma maọbụrụ na ha tinyere aka kwado Naijiria nke ọma.

May na-ewukwa na Sosal media ugbua makana ya na ndị ụmụakwụkwọ Saut Afrika na-agba egwu.

Buhara asaala okwu Trump kwuru

Buhari na Trump

Ebe foto si, Getty Images

Ụlọọrụ onyeisiala Muhammadu Buhari ekwuputela na okwu ekwuru na onyeisiala Mba Amerịka kwuru nwereike ị bụ aghụghọ ndị otu ndọrọndọrọ ọchị na anọghị n'ọkwa ọchịchị kụnyere n'igwe mgbasa ozi di icheiche.

Ohaneze ndịgbo enyeela Buhari iwu kpụ ọkụ n'ọnụ

Ndị Igbo

Ebe foto si, Getty Images

Kingsley Dozie bụ onye ndu ndị ntorobia Ohaneze ndịgbo akpọọla oku ka onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kụwa akụoyibo nsugbe n'ihe gbasara ọkwa ọchịchị 2023.

Ha nyere ya rue kemgbe ụbọchị mbụ nke ọnwa september ị kuwpute nke a.

Jamie Vardy na Gary Cahill agaala ezumike

Jamie Vardy

Ebe foto si, Getty Images

N'egwuregwu, Jamie Vardy na Gary Cahill bụ ndị ọgba bọọlụ ala Ingland ekwuola na ha agaghị eso otu ala ha n'igba bọọlụ ruo nwa oge.

Ha kwuru na ha na-eme nke a makana ha chọrọ ị nye ndị ọzọ ohere ịbata n'otu ọgba bọọlụ ala ha. Mana ha kwuru na ha ga-alagachị na ngwụcha oge a.

Dike n'ịpịa Tennis bụ Andy Murray ekwuola na obi dị ya aṅụrị dịka ọ merịrị James Duckworth mgbe ha sọkọtara mpị n'asọmpị US Open.

Gee akụkọ anyị n'otu nkeji

Aha nkeananụānụ,

Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri anyị

Nwanyị a ji egwu agwọ ọrịa

Aha onyonyo,

Achọrọ m ịgụ egwu n'eluigwe - nwaanyị na-agụ egwú n'ahia