'Abba Kyari enweghi ike ịnata aka azụ' - Garba Shehu

Garba Shehu kwuru na ebubo eboro Abba Kyari bụ asị
Nkenke aha onyonyo Garba Shehu kwuru na ebubo eboro Abba Kyari bụ asị

Ụlọọrụ onyeisiala ekwuola na akụkọ kwuru na Abba Kyari bụ onyeisi ndị ọrụ onyeisiala nara aka azụ bụ okwu asị.

Otu ụlọ mgbasaozi bipụtaaburu akụkọ kwuru na Kyari nara ngarị ruru nde naịra 29 iji nye ọrụ maka mbubata ụgbọala Hiluz mkpụrụ 15.

mana onye nkwuchiteọnụ onyeisla bụ Garba Shehu kwuru na akụkọ ahụ na-akpasu iwe maka na onweghi mgbe Kyari na onye ọbụla nwere ọgbakọ nzuzo.

Shehu kwuru na ebubo ahụ si n'aka ndị na-achọ ịkatọ onyeisiala dịk ntuliama 2019 na-akpudebe nso.

Mana na nzaghachi nke ya, Kyari kwuru; " Onweghi eziokwu dị n'akwụkọ ahụ, ọ bụ asị ọcha. Onweghi ụdị pọtị ha chọrọ ite m ga-anyado.

"Agwala m ndị ọkaịwu m ka ha kpụpụ ndị na-ebu akụkọ asị ahụ ụlọikpe."

Nke abụghị mbụ a na-ebo otu onye ọrụ Buhari ebubo ngari na aka azụ agbanyeghi ọgụ gọomenti na-alụsọ mpụ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: